Man City ọ ga-atọ onwe ha n'agbụ taa?

Man City na-atụ anya imeri Liverpool iji gafe agba ọkara ikpeazụ n'asọmpi Uefa champịọns Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Man City na-atụ anya imeri Liverpool iji gafe agba ọkara ikpeazụ n'asọmpi Uefa champịọns

N'ime otu izuụka, ndị Man City ahụtala ezigbo ọdịda n'ogo akụ m bọọlụ haa dịka ndị Liverpool na Man United meriri ha n'asọmpi.

Mana ha nwere ohere ịtọpụ onwe ha n'agbụ ọdịdị n'abalị mgbe ha ga-ezute Liverpool ọzọ.

Liverpool jiri ọkpụ atọ chara acha merie ndị Man City n'ụkwụ mbụ n'asọmpi Uefa champịọns.

Ọtụtụ ndị mmadụ kwuru uche ha ebe a;

Onye ntuziaka ndị otu ahụ bụ Pep Guardiola ekwuola na ga-agba bọọlụ 'zuru oke' iji nweta mmeri n'asọmpị ahụ.

O kwuru na ọ ka kwesiri ike na ndị otu ya nke "pụrụiche".

"Otu ụzọ eji agba bọọlụ dị nma bụ inwe obi dị mma," dịka o kwuru.

"Ị gafe, ikwesiri ịgba bọọlụ zuru oke, wepụta ohere, hapụ itufu ohere dị ukwuu, anyị kwesiri i chekwa ohere ndị anyị nwetara nkeọma.

Anyị nwere nkeji iri itoolu, ihe ọbụla nwere ike ime, ihe anyị ga-eme bụ ịgbalị," Guardiola kwuru.

N'aka nke ọzọ otu AS Roma ga-ezute ndị Barcelona, iji megwara ihe ndị Barcelona mere ha n'ụkwụ mbụ site n'inye ha ọkpụ anọ asatara otu.

Akụkọ ga-amasị gị:

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a