Asọmpi Commonwealth: Ndị Kamerun 8 ahapụla ndị otu ha

Arcangeline Fouodji Sonkbou Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Ndị ọrụ Kamerun kwuru na Arcangeline Fouodji Sonkbou bụ onye na-ebuli igwe so na ndị egwuregwu na-efu

Ndị ọrụ gọọmenti Cameroon ekwuola na mmadụ asatọ n'ime iri abụọ na anọ ha kpọ gaa asọmpi egwuregwu Commonwealth n'Australia efuola n'ebe obibi ha.

Onye ntaakụkọ so otu Cameroon bụ Simon Molombe gwara ndị ọrụ BBC na ha na-eche na ọ bụ 'mgbaghapụ ka ha mere', ma kwuokwa na ha ekpesala ofufu ha n'aka ndị uweojii Australia.

Molombe kwuru na anya ikpeazụ a hụrụ mmadụ atọ ndị na-ebuli igwe bụ n'ụbọchị mọnde, ebe ndị na-akụ ọkpọ ise milara na tuusde.

"Ndị egwuregwu a pụrụ n'usoro atọ - mmadụ atọ bu ụzọ pụọ n'abalị Epreelụ 8. Achọwakwara mmadụ abụọ ọzọ n'ụbọchị 9, ebe mmadụ atọ hapụrụ imeụlọ ha n'abalị ụnyaahụ."

"Mmadụ atọ ndị na-ebuli igwe na ndị na-akụ ọkpọ ise ahụ so n'otu nwere ọzụzụ n'ogige dị na Warwick tupu anyị agawa Gold Coast. Mana ebe a, naanị isii n'ime ha sonyere n'asọmpi ha, ebe abụọ pụrụ na-asọghị mpi ọbụla."

"Ndị ọrụ otu Cameroon agwala ndị uweojii Australia ihe na-aga nakwa ndị ọrụ ha nọ na Kamerun."

Akụkọ ndị ga-amasị gị

Ndị Cameroon kwuru na otu ha nwere akwụkwọ ikike e ji agafe mba ọzọ nke bekee kpọrọ visa, ruo ụbọchị 15 nke ọnwa Mee.

Edepụtara aha ndị egwuregwu a na-efu - Olivier Matam Matam, Arcangeline Fouodji Sonkbou na Petit Minkoumba bụ ndị na-ebuli igwe, ebe Christian Ndzie Tsoye, Simplice Fotsala, Arsene Fokou, Ulrich Yombo na Christelle Ndiang bụ ndị na-akụ ọkpọ.

Molombe kwuru "Ihe ndị a gbara ọsọ mere wutekwara ndị isi - ụfọdụ esoghịdị sọọ mpi"

"Ekpere olileanya anyị bụ na ha ga-alọghachite nwee ike soro ndị ọzọ laghachị Cameroon."

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a