Commonwealth: Otu Naịjirịa gara asọmpi ga-alọta echi

Otu Naịjirịa Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Otu Naịjirịa na-emekarị ọfụma n'asọmpi Commonwealth kwa mgbe kwa mgbe

Otu nọchitere anya Naịjirịa n'asọmpi egwuregwu Commonwealth emere na mba Australia, ga-alọghachite Naịjirịa n'ụtụtụ echi.

Naịjirịa mere ọfụma ma nweta nchịkọta ihe nrite ọla iri abụọ na anọ (24) nke bụ ọlaedo itoolu (9), ọlaọcha itoolu (9) na ọlanchara isii (6) n'ime egwuregwu itoolu ha so sọọ mpi.

Otu a nọchitere Naịjirịa ga-alọta dịka dike, site na mba Dubai, ebe ha ga-eji ụgbọelu Emirates abụọ.

Ụfọdụ ga-efedata na Lagos ebe ndị ọzọ ga-efedata n'Abuja.

Minista na-ahụ maka egwuregwu bụ Solomon Dalung, toro ike ndị otu a ma kwuo na ha mere ọfụma n'asọmpi a karịa asọmpi ndị Naịjirịa merela n'afọ ndị gara aga.

Dalung kwuru "Anyị enyochaala omume anyị n'asọmpi Gold Coast ma chọpụta na ị tụnyere etu ndị otu gara asọmpi egwuregwu Glasgow na ndị anyị kpọgara Gold Coast ha n'ibu, ị ga-ahụ na otu nke a mere ọfụma karịa."

Isiokwu Ndị Emetụtara

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a