Emeka Nwani: Gbakọtanụ aka ọnụ mezie egwuregwu bọọlụ Naịjirịa

Egwuregwu bọọlụ
Nkenke aha onyonyo BBC Igbo na Emeka Nwani

BBC Igbo na Emeka Nwani nwere mkparịtaụka na Facebook na Instagram Live banyere nsogbu chere egwuregwu bọọlụ Naịjirịa n'ihu na ụzọ mgbapụta n'ụbọchị itoolu nke ọnwa Mee.

Emeka Nwani kwuru na nsogbu chere egwuregwu bọọlụ alanyị n'ihu sị n'aka gọọmentị, ndị na-aghazi bọọlụ bụ League Management Company (LMC), ndị ntaakụkọ nakwa ndị nkwado egwurewgu bọọlụ.

O kwuru na ọ bụ ụfọdụ iwu ndị gọọmentị hiwere bụ ihe na-adọghachị egwuregwu bọọlụ Naịjirịa azụ.

N'aka nke ndị LMC, Nwani kwuru na ndị ha anaghị enye ndị otu bọọlụ nupuruisi n'iwu ezigbo ntaramaahụhụ kwesiri ha.

Ọ gara n'ihu kwuo na ọtụtụ ndị ntaakụkọ Naịjirịa anaghị achọ ide ihe gbasara egwuregwu bọọlụ Naịjirịa.

N'ikpeazụ, Emeka Nwani rịọrọ arịrịọ ka gọọmentị, ndị LMC, ndị ntaakụkọ na mmadụ niile hụrụ egwuregwu bọọlụ n'anya gbakọta aka i ji mezie ọnọdụ ya na Naịjirịa.

Akụkọ ga-amasị gị:

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a