Otu egwuregwu Naịjiria ga-ebido ọzụzụ ha n'ụbọchị 22 n'ọnwa Mee

Ndị otu Naịjiria ga-aga Rọshịa Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Naịjirịa na mba Congo, England na Czech ga-asọ mpi enyi na enyi tupu e bido asọmpị iko mbaụwa n'ezie

Otu egwuregwu Naịjiria bụ 'Super Eagles' tozuru ịsonye n'asọmpị iko mbaụwa ga-eme na Rọshịa n'ọnwa Juun ebidola nkwado asọmpị ahụ.

Akụkọ na-ekwu na ha ga-ebido ọzụzụ ha n'ụbọchị 22 nke Mee n'ọgbọ egwuregwu dị n'obodo Uyo, nke bụ isi obodo Akwa Ibom steeti.

E nyere ha rue ụbọchị 21 nke mee iji rute n'ọgbọ egwuregwu ahụ iji bido nkwado ha.

Ha nwekwara ụfọdụ asọmpị iji kwado dịka Amanju Pinnick na-ekwu na nke ha na mba Congo ga-aga n'ihụ agbanyeghị ọrịa Ebola na efee n'obodo ha.

Cheta na onye nkuzi otu ha Gernot Rohr akpọọla aha ndị ọgba bọọlụ 30 ga-esonye n'asọmpị iko mba ụwa a na Rọshịa.

Lee ebe otu na-ahụ maka egwuregwu bọọlụ gosiri aha ndị ga-anọchite anya Naịjrịa n'elu soshal midia:

Akụkọ ga-amasị gị:

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a