Lionel Messi na-akwadọ ị nata akpụkpụ-ụkwụ ọlaedo

Lionel Messi Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Messi emeriela dịka onya ọkachasị agba bọọlụ na FIFA ugboro ise

Ọgba bọọlụ Lionel Messi meriri dịka onye kachasị enye goolu n'asọmpị La Liga na mpaghara Spain nke afọ a.

Ihe a pụtara na Lionel Messi nwere ike ị bụ onye ga-emerị akpụkpụ-ụkwụ ọlaedo n'ihi na o nyere goolu ruru iri atọ na anọ n'otu bọọlụ ya bụ Barcelona n'afọ a.

Lionel Messi meriri kwara iko Pichichi dịka onye kachasị enye goolu n'asọmpị Primera.

Cristiano Ronaldo bụ onye soro Messi n'azụ makana o nyere goolu ruru iri abụọ na isii.

Ihe a pụtara na Messi emeriela iko Pichichi ise, mana Ronaldo meriri sọọsọ atọ.

Messi na Ronaldo ha n'akpụkpọ-ụkwụ ọlaedo makana ha abụọ nwere anọ anọ, mana mmeri a Messi meriri dịka onye kachasị enye goolu n'afọ a, were ike ị me ya gafe ya n'okwa nke a.

Mmeri nke a mekwara ya ugboro asa Messi nyere goolu kariri iri atọ n'otu afọ.

Akụkọ ga-amasị gị:

Isiokwu Ndị Emetụtara