Garba Shehu akatọọlụ PDP ọhụrụ

Ebe foto si, @GarShehu
Garba Shehu
Ọnụ na-ekwuchitere onyeisiala Naịjirịa bụ Garba Shehu kwuru na ọ bụrụ na ndị Naịjirịa kwado otu ndọrọndọrọ ọchịchị PDP na ntuliaka 2019, ego niile gọmentị a chọpụtara n'aka ndị zuru ego Naịjirịa ga-alaghachị azụ n'aka ndị zuru ego ahụ.
Shehu dere ihe a, n'ime akwụkwọ o nyere ndị ntaakụkọ gbasara okwu PDP na-ekwusi ike ugbua akpọrọ 'Change the Change campaign' na bekee.
O kwukwara na Naịjirịa ga-alaghachị azụ gawa ebe ha nọrọ tupu afọ 2015, na kwa megharị ihe ọma niile otu APC butere na Naịjirịa.
Shehu dọrọ Naịjirịa aka na nti, ka ha cheta na ọ bụ mpu na aghọghọ mere ka APC merie PDP na ntụlịaka afọ 2015.
N'ọnụ okwu ya, ''APC bụ sọọsọ otu ndọrọndọrọ ọchịchị na-ebuso mpu na aghọghọ agha na Naịjirịa.''
Shehu dekwara na ọ bụ ezie na ọ bụ gọọmentị PDP mụpụtara EFCC, mana onweghị ihe ọbụla EFCC mere ruo oge ọchịchị APC.
Mana ọnụ na-ekwuchitere PDP bụ Kola Ologbondiyan kwuru na ha na-elebe anya n'okwu a Garba Shehu kwuru, ma na-akwado ịzaghachị ya okwu a.