Mohamed Salah ọ ga-agba asọmpi iko mba ụwa?

Mohamed Salah Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Mosalah nwere mmerụ ahụ nkwapụ nku

Egwu ji ọtụtụ ndị hụrụ egwuregwu bọọlụ n'anya karịsịa ndị nkwado Liverpool na mba Egypt na Mohamed Salah maka mmerụ ahụ ya.

Cheta na Salah nwere mmerụ na nku aka ya mgbe Liverpool na Real Madrid zutere n'asọmpi ikpeazụ nke Uefa Champịọns nke mere eji wepụ ya n'ike.

Onye nchịkọta otu Liverpool bụ Jurgen Klopp kwuru na mmerụ ahụ bụ nnukwu ihe na ọ dịka ọ gbajiri ọkpụkpụ olu.

Mana otu na-ahụ maka egwuregwu na mba Egypt kwuru na ọ bụ naanị nkwapụ nku aka ka Salah nwere.

N'ime ihe ndị a niile, amaghị ma mmerụ ahụ ọ ga-ekwe ka Salah soro otu bọọlụ Egypt gbaa asọmpi iko mba ụwa nke dị nso nso.

Ndị nyocha ahụ kwuru na ọ ga-ewe onye nwere nkwapụ nkụ izu iri na otu rue izu iri na isii iji gbakee nkeọma.

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Ramos kpachiri aka Salah dịka ha na-ada n'ala

Kama Mohamed Salah ekwuola site n'akara twitter na instagram ya na ọ ga-esonye ndị otu gbaa asọmpi iko mba ụwa.

Ọ kelekwara ndị nkwado ya maka ịhụnanya ha gosiri ya n'oge uhe mgbu a.