Uwe ndị Super Eagles bụzị 'ahịa iwu'

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionIhe onyonyo na-egọsị uwe ọhụrụ ndị Sụpa Igụls

Akụkọ na-apụta na London na-egosi na ndị mmadụ kwụru n'ahịrị na London na-eche ka agape ụlọ ahịa ndị Nike makana ọ bụ tata ka ebidoro ire uwe ndị Super Eagles.

Cheta na uwe a bụ nke ndi mmadụ kwuru na ha kacha hụ n'anya mgbe ewepụtara foto uwe ndi otu egwuregwu dị icheiche ji a ga iko mba ụwa na Rọshịa.

Ndị mmadu na Twitter na-ekwu na ndị mmadụ na-eche ka ụlọ ahịa ndị Nike gbapere tata akwụrula n'ahịrị tupu chi efo. Nke mere ndị ụlọ ọrụ BBC na London jiri nọrụ n'ala ịgba ndi mmadụ ajụjụ ọnụ banyere okwu a.

Na Twitter, @A01379 setere ihe ọhụrụ.

@conroy_bumpus setere foto na-egosi ndị a kwụ n'ahiri.

Onye ọrụ BBC Peter Okwoche na onwe ya setere ihe onyonyo gosiri ndị na-ahiri.

@ogundamisi kwuru na ọ bụ sọsọ okwu uwe a ka a na-ekwu na ụlọ ọrụ ya.

Ihe a niile mere ojighi tụọ n'anya mgbe ndị @DoubleEph edere na Twitter na ya bu uwe agwụla.

Ndi niile na-eme ugbua abughị ihe mere na mberede.

BBC Igbo jụbụrụ ajujụ maka uwe ndi Super Eagles a na-ahu na Naịjirịa ebe ndị mere ya ebidobeghi ire ya.

Lee otu n'ime uwe nke adiboroja ndị mmadụ na intanet.

Image copyright Stylerum.com
Nkenke aha onyonyo Ụfọdụ ndị ahịa iwu ebidola ire uwe Naịjirịa na-echeghị ka ụlọọrụ Nike webata ya n'ahịa