World Cup 2018: Senegal emeela ihe mba Afrịka ndị ọzọ na-emenwughị

Mba Senegal

Senegal mere ihe mba Afrịka ndị ọzọ na-emenwughị site n'iji goolu abụọ asatara otu merie mba Poland.

Ndị Senegal gosiri ndị Poland nkarị ka mba abụọ a zutere n'Iko Mbaụwa.

Mba ndị dị n'Afrịka kwụ Senegal n'azụ maka na naanị ha bụ ndị si Afrịka a na-emeribeghị kemgbe asọmpi a bidoro.

Ha gbara n'ọgbọ egwuregwu nke Spartak na mba Rọshịa.

Ka o ruru nkeji 37, ndị Senegal nyere goolu mbụ ha ka Idrissa Gueye gbara bọọlụ kụrụ Thiago Cionek bụ onye Poland n'ahụ ma banye na poostu.

Na nkeji 60, M'Baye Niang gbakara neetị Szczesny, mere ka Senegal nweta goolu ha nke abụọ.

Goolu ahụ mara ezigbo mma ile anya maka etu bọọlụ si rute Niang si n'ọkara nke ha gbabata ma gbakaa neetị ka Szczesny gbapụtara ezi wee hapụ neetị ya ohere, na-enweghị onye na-eche ya.

Ka o ruru nkeji 86, onye Poland bụ Grzegorz Krychowiak, gbakara neetị ndị Senegal, iji sata otu.

Mana goolu o nyere emeghị ka ha na Senegal hara n'otu maọbụ nye ha mmeri.

Ndị na-agbara Senegal bọọlụ mechara gbawa egwu n'ọgbọ egwuregwu, ebe ndị na-akwado ha welitere olu n'abụ ha na-agụ.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: