World Cup 2018: Spen emeriela Ịran

Mba Spen Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Ndị Spen buliri Iko Mbaụwa nke e hibere na Saụt Afrịka n'afọ 2010

Diego Costa nyere goolu mere ka Spen na Pọtugal hara n'ọkwa na tebulu otu B.

Goolu Costa nyere na nkeji 54, nyere Spen mmeri mere ka pọịntị ha na ndị Pọtugal hara.

Goolu a mekwara ya nke atọ ọ na-enye kemgbe asọmpi Iko Mbaụwa nke 2018 a bidoro.

Na nkeji 64, ogbu bọolụ gufuru goolu ndị Iran nyere ka o nyochara ihe nkiri VAR. Ọ gufuru ya maka na Saied Ezatolahi nyere goolu nọ ihe bekee kpọrọ 'offside'.

Ndị Iran nwara ike ha ịsata goolu e nyere ha tụmadu nke a gufuru a gufu, mana ike ha niile enweghị ihe ọ pụtara n'ihu poostu.

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Ndị Ịran abanyebeghị agba mgbapụ kemgbe ha bidoro ịga asọmpi Iko Mbaụwa.

Ọ bụrụ na Iran meriri, ha na Pọtugal gaara ahara na pọịntị maka na ha meriri Moroko oge ha zukọrọ n'egwuregwu mbụ ha gbara.

Ka Spen na Moroko ga-ezute n'egwuregwu a ga-agba ọzọ, ebe Pọtugal na Iran ga-ezute, mba abụọ a ga-eji ume ha niile gbaa ya bụ egwuregwu nke ga-eme ka a mata onye ga-anọ n'elu tebulu otu B.

Ohere ka dị n'otu B, maka na Pọtugal na Spen nọ na pọintị anọ, ebe Ịran nọ na pọịntị atọ.

Ọ bụrụ na Ịran merie Pọtugal nweta pọịntị isii, ha ga-agafe n'agba mgbapụ nke ha ga-eru agba ahụ kemgbe ha bidoro ịga asọmpi Iko Mbaụwa.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: