World Cup 2018: Jamini alaala na nta ka ha gbara Swidin 2 - 1

Nkwado ndị mba Jamini

Ndị Jamini bụ ndị buliri Iko Mbaụwa n'afọ 2014, gbara isi akwara ka ha na-enweta mmeri ha nke mbụ n'asọmpi nke afọ 2018 a.

Goolu Toni Kroos ji 'free kick' nye na nkeji 95, bụ ihe zọrọ ndị Jamini ma nye ha olileanya ịnọru ma chere ihe ha ga-agbata n'egwuregwu ha na Saụt Korea n'izu na-abịa.

Obi mapụrụ ndị Jamini ka Ola Toivonen bu ụzọ gbakaa neetị ha na nkeji 32 n'ọkara nke mbụ, mana Marco Reus nyere goolu kpalitere mmụọ ha na nkeji 48.

E nyere Jerome Boateng na-agba n'azụ ndị Jamini akwụkwọ ọbara ọbara na nkeji 82, mere ka ndị Jamini fọ mmadụ 10 n'ọgbọ egwuregwu.

Boateng bu ụzọ nwetara akwụkwọ edo edo abụọ, tupu ogbu bọọlụ enye ya nke ọbara ọbara, pụtara na ọ gaghị eso asọ mpi nke Jamini na Saụt Koria.

E nyekwara Albin Ekdal na Sebastian Larsson bụ ndị Swidin, akwụkwọ edo edo.

Otu onye aha ya bụ Dan Walker dere na Twitter na agbapụrụ ụfọdụ ndị mba buliri Iko Mbaụwa n'agba nke otu (group stage) n'asọmpi nke na-eso nke ha buliri.

Mmeri Jamini meriri pụtara na amabeghị ndị ga-esi n'otu F gafee agba mgbapụ. A ga-amata ya n'ụbọchị egwuregwu nke ikpeazụ ha ga-agba.

Jamini nwere pọịntị atọ, ga-ezute Saụt Koria na-enweghị pọintị ọbụla, ebe Mekziko nwere pọintị isii ga-ezute Sweden nwere pọịntị atọ.

Ndị nọ n'oche Swidin: Karl-Johan Johnsson, Kristoffer Nordfeldt, Isaac Thelin, Marcus Rohden, Jimmy Durmaz, Pontus Jansson, Oscar Hiljemark, John Guidetti, Gustav Svensson, Filip Helander, Emil Krafth, Martin Olsson.

Ndị nọ n'oche Jamini: Marc-Andre ter Stegen, Kevin Trapp, Julian Brandt, Marvin Plattenhardt, Matthias Ginter, Mats Hummels, Mario Gomez, Mesut Ozil, Niklas Sule, Sami Khedira, Ilkay Gundogan, Leon Goretzka.

Ndị bidoro bọọlụ Swidin: Robin Olsen; Mikael Lustig, Victor Lindelof, Andreas Granqvist, Ludwig Augustinsson; Viktor Claesson, Sebastian Larsson, Albin Ekdal, Emil Forsberg; Ola Toivonen, Marcus Berg.

Ndị bidoro bọọlụ Jamini: Manuel Neuer; Joshua Kimmich, Antonio Rudiger, Jerome Boateng, Jonas Hector; Sebastian Rudy, Toni Kroos; Marco Reus, Thomas Muller, Julian Draxler; Timo Werner.