Nwaanyị nọ na 'Mortuary' tetere ka a chọrọ ili ya

Saụt Afrika Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Onye eche na ọnwụru na SA

Ndị dọkịnta bekee ekpebiela na nke ya agaala.

Ndị ọrụ gbata gbata ambụlansi si na nke ya agaala na "ndụ afọghịzị n'ime ya".

Mana mgbe onye na-elekọta ozu bịara lee anya n'ụlọ ntụoyi ọzụ, ọhụrụ na ya bụ nwaanyị ka na-ekuume.

Gerrit Bradnick bụ onyeisi otu gbatagbata sị na ya bụ nwaanyi so na ndị nwere ihe mberede okporoụzọ nke tara isi mmadụ abụọ na June 24 afọ a.

Nwaanyị a amabeghị aha ya nọ n'ụlọọgwụ ugbua anata ọgwụgwọ, dịka ndị ọrụ ụlọọgwụ ahụ gbaara BBC ama.

Ihe a nke mere na mba Saụt Afrika bụ na Gauteng province ka ọmere.

Dika ndị ọrụ gbanụgbanụ ụlọọgwụ ahụ na-eme nyocha gbasara ihe, Bradnick sị na ya echeghị na ya bụ ọgbataụghị sị ha n'aka ya.

Akụkọ BBC kwuru na nke a abụghị mbụ na afọ a onye nwụrụ anwụ kuliri na ụlọ ọbaozu bekee kpọrọ "mortuary".

Nkenke aha onyonyo Mapụ Saụt Afrika na-egosi ebe ihe a mere

Afọ asaa gara aga, na otu Saụt Afrika ahụ, otu nwoke gbara afọ iri na ise tetere n'ọnwụ tiwe mkpu n'ụlọ ọbaozu nke ndị na East Cape.

N'otu aka ahụ n'afọ 2016, otu nwoke eche na onwuru n'ihe mberede okporoụzọ mere na KwaZulu Natal, ka chi foro, ahụ na ọ ka dị ndụ.

Nwoke ahụ mechara nwụọ ihe dịka elekere ise okulichara.

N'ebe ọzọ, n'ọnwa mbụ nke afọ a, nwoke nọ mkpọrọ na mba Spen nke ekpebiri na ọnwụọala kuliri mgbe achọrọ ịbọwa ya afọ mata ihe gburu ya.

Ndị dọkịnta bekee atọ ekpebiela na ya bụ nwoke anwụọla pii.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Isiokwu Ndị Emetụtara

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a