World Cup 2018: England abaala agba anọ ikpeazụ

Kọlọmbịa na Ịngland

Mba Ịngland jiri penarịtị merie ndị Kolombịa na Mọsko n'abalị ụnyaahụ.

Eric Dier nyere goolu mmeri oge Jorndan Pickford napụtachara ha n'aka Carlos Bacca.

Ịngland ga-ezutezi mba Swidin na Samara ụbọchị 7 ọnwa Julai.

Onye nkuzi ndị Ịngland bụ Gareth Southgate kpo ndị ọrụ ya ṅụrịa maka mmeri ahụ dịka ndị ọgba bọọlụ ya na-ekele ndị mmeri ha bụ Pickford na Dier dịka ha nwere mmeri mbụ na agba mgbapụ na asọmpi siriike dịka Iko Mbaụwa kamgbe afọ 2006.

Ọ dịka ndị egwu Southgate enweghi ọkọ kọrọ ha n'ahụ dịka ha natasịrị penarịtị nke ajọ agwa nyere Harry Kane mana ndị Yerry Mina nke Kolombia satara ya na ngwụcha asọmpi ahụ nke mere ndị na-akwado Kọlọmbịa ji gbaka n'ọṅụ.

E tinyekwuru nkeji 30 mana onweghi onye nyeliri goolu n'oge ahụ nke mere e ji baa na penarịtị.

Onweghi mba meriri Iko Mbaụị̀a na mbụ nọ n'etiti Ịngland na agba nke ikpeazụ. Onye meriri n'agba nke anọ ikpeazụ ga-ezute mba Kroeshia maọbụ ndị na-akwa ọbịa Rọshịa maka agba ikpeazụ a ga-egba na Mọsko ụbọchụ 15 ọnwa julai.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: