World Cup 2018: France ejirila 1-0 merie Belgium

Ọkọlọtọ Frans na Beljịọm Image copyright Getty Images

Otu abụọ a siri ike n'egwuregwu mana Frans gbapụrụ Beljiọm, nke ga-eme ka Beljiọm na onye emeriri n'etiti Ịngland na Kroeshia zute ma zọọ ọkwa onye nke atọ Bekee kpọrọ 'third place'.

Goolu Umtiti ji isi taba na neetị nyere Frans mmeri mere ka ha banye n'agba ikpeazụ nke atọ ha n'ime afọ 20.

Blaise Matuidi, Raphael Varane na Kylian Mbappe nwukere ka kpakpando n'egwuregwu a.

Nkeji 90+6: E gbuchiela bọọlụ.

Nkeji 90+5: Frans na-anwasi ike inye goolu ọzọ.

Nkeji 90+4: E nyela Vertonghen akwụkwọ edo edo.

Nkeji 90+3: Griezmann gbara shọọtụ mana Courtois ghọrọla ya.

Nkeji 90+1: E nyela Mbappe akwụkwọ edo edo maka ịghọ aghụghọ na a gbaturu ya.

E tinyekwuola nkeji isii.

Nkeji 90: Beljiọm ewepụla Chadli tinye Batshuayi.

Nkeji 89: De Bruyne chọrọ ibunye Lukaku bọọlụ mana ọ banyeghị etu o kwesịrị.

Nkeji 87: Beljiọm agbaala 'free kick' ha nwetara, mana N'zonzi ji isi tafuo ya ka ọ ghara ibanye na poostu ha.

Nkeji 86: E nyela Kante akwụkwọ edo edo maka igbatu Hazard.

Nkeji 85: Hazard na Matuidi akụkọọla ọzọ. Mere ka Frans wepụ ya tinye Tolisso.

Nkeji 84: Frans ewepụla Giroud tinye N'zonzi.

Nkeji 82: Ndị nlekọta abịala kpọrọ Matuidi ka ya na Hazard kụkọtara ọnụ, mana ọ lọghachịtara.

Nkeji 81: Beljiọm anwaala poostu ọzọ site n'aka Witsel, mana Lloris kụpụrụ ya.

Nkeji 80: Beljiọm ewepụla Fellaini tinye Carrasaco.

Nkeji 79: Hazard butere bọọlụ, Giroud gbaturu ya n'ihu poostu mana enyeghi ya 'free kick'.

Nkeji 78: Griezmann gbara 'corner' ndị Frans. Pogba nwetara ya mana isi ya apụtaghị.

Nkeji 75: De Bruyne butere bọọlụ n'ihu poostu mana isi apụtaghị.

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionOnye ka ị chere ga-ebuli iko mba ụwa?

Nkeji 73: A gbaala Umtiti bọọlụ n'agba.

Nkeji 70: E nyela Alderweireld akwụkwọ edo edo.

Nkeji 68: Frans enwetala 'free kick' n'aka Griezmann.

Nkeji 65: Fellaini tara bọọlụ Mertens bunyere ya isi n'ihu poostu, mana ọ banyeghị.

Nkeji 64: Hazard na-agbagharị ịma ma ọ ga-enweta bọọlụ nye goolu. Mertens agbaala shọọtụ mana Lloris ghọrọla ya.

Nkeji 63: E nyela Hazard akwụkwọ edo edo.

Nkeji 61: Beljiọm nwetara ohere inye goolu site n'aka Mertens na De Bruyne mana ọ banyeghị. Lloris ghọrọla nke De Bruyne.

Nkeji 59: Beljiọm ewepụla Dembele tinye Mertens.

Nkeji 55: Giroud ebuteala bọọlụ ka Matuidi bunyere ya bọọlụ, mana otu abụghị n'ezi.

Nkeji 51: GOOOLLLUUU!!!! Umtiti ejirila isi nye goolu.

Nkeji 47: Witsel bunyere Lukaku bọọlụ ọ tara isi, mana ọ gafere elu poostu.

Nkeji 46: E nwebeghị onye nyere goolu n'ime egwuregwu a.

Egwu ebirila ọkụ n'ọkara nke abụọ.

A gaala ezumike nkeji 15.

Nkeji 45: E tinyekwuola otu nkeji n'ọkara a. A ga-ejinwu ya mere ihe? Umtiti butere bọọlụ gaara aba na neetị mana ọ kụrụ n'aka Lukaku pụọ.

Nkeji 44: Griezmann gbara 'free kick' mana ọ gafeghị ahụ ndị Beljiọm kwụchiri ihu poostu.

Cheta na Thierry Henry gbabuuru Frans bọọlụ ma soro n'otu buliri Iko Mbaụwa n'afọ 1998, bụzị osote onye nchịkọta otu Beljiọm.

Image copyright Getty Images

Nkeji 39: Pavard gbara shọọtụ mana ụkwụ Courtois tinyere mere ka bọọlụ pụọ 'corner' mana enweghị ihe Frans ji ya bụ 'corner' mee.

Nkeji 37: Giroud dina n'ala, ndị nlekọta bịara ileta ya maka ahụ ọ merụrụ ka ya na Dembele kụkọtara.

Nkeji 36: Frans kesara ezigbo okwe ka ha butere bọọlụ n'ọkara ndị Beljịọm, mana Griezmann agbataghị ihe ọ chọrọ ịgba.

Nkeji 33: Giroud na Griezmann na-acha ndị Beljiọm ọkụ dị iche n'ọkara a.

Nkeji 32: Frans etetala n'ụra ka ha bidoro chawa Beljiọm ọkụ. Giroud nwetara bọolụ, mana ọ banyeghị.

Nkeji 30: Griezmann gbafeere Pavard 'free kick' ha nwetara. Pavard gbaliri ya elu, Giroud tara bọọlụ isi n'ihu poostu Beljiọm, mana ọ banyeghị.

Nkeji 28: De Bruyne mere ka Umtiti gbafuo bọọlụ n'ihu poostu, mere ka Lukaku ghara inweta ohere igbakpu ya na neetị.

Nkeji 25: Matuidi na Hernandez metere 'corner' nke Griezmann gbara nso poostu mana Fellaini tafuru bọọlụ ka ọ hara ịbanye na poostu Beljịọm.

Nkeji 21: Lloris akụpụla bọọlụ Alderweireld gbara sitere na 'free kick'. Ọ bịara n'ihu poostu.

Nkeji 18: Hazard ebutela bọọlụ n'ihu poostu ndị Frans, mana ọ kụrụ n'elu poostu dapụ.

Nkeji 17: Matuidi agbaala shọọtụ, mana Courtois ghọrọla ya.

Image copyright Getty Images

Nkeji 15: Hazard ebutela bọọlụ ka De Bruyne bunyere ya, mana ọ gafere ihu poostu kama ibanye n'ime ya.

Nkeji 12: Mbappe ebutela bọọlụ gbapụ ọsọ n'ihu poostu Frans ka Pogba bunyere ya bọọlụ, mana oche goolu ghọrọla ya tupu o nweta ohere ịgba ya na poostu.

Nkeji 10: Frans nwetara ohere n'ihu poostu ndị Beljịọm, mana isi apụtaghị.

Nkeji ise: Hazard agbaala shọọtụ! Mana ọ pụrụ 'corner'.

Nkeji anọ: Frans bu egwu bịa egwuregwu a, ha achọghị inye ohere maka ihe ọbụla.

Otu nkeji: E bidola egwuregwu ọkara-ikpeazụ n'ọgbọ egwuregwu St. Petersburg.

Nzukọ a mere ya ugboro 74 otu abụọ a na-ezute ibe n'egwuregwu bọọlụ.

N'ime otu abụọ a, Frans ebuola Iko Mbaụwa n'afọ 1998, mana nke a bụ ugboro isii ha na-eru n'agba ọkara-ikpeazụ.

Irute ọkara-ikpeazụ a, Beljịọm merichara egwuregwu ise ha gbara.

Ndị nọ n'oche Beljiọm: Koen Casteels, Simon Mignolet, Adnan Januzaj, Youri Tielemans, Thomas Vermaelen, Thorgan Hazard, Leander Dendoncker, Yannick Carrasco, Dries Mertens, Michy Batshuayi, Dedryck Boyata.

Ndị nọ n'oche Frans: Alphonse Areola, Steve Mandanda, Presnel Kimpembe, Corentin Tolisso, Benjamin Mendy, Steven N'Zonzi, Ousmane Dembele, Djibril Sidibe, Thomas Lemar, Adil Rami, Florian Thauvin, Nabil Fekir.

Ndị Beljiọm bidoro bọọlụ: Thibaut Courtois; Vincent Kompany, Toby Alderweireld, Jan Vertonghen; Axel Witsel; Nacer Chadli, Mousa Dembele, Maroaune Fellaini, Kevin De Bruyne; Romelu Lukaku, Eden Hazard.

Ndị Frans bidoro bọọlụ: Hugo Lloris; Benjamin Pavard, Raphael Varane, Samuel Umtiti, Lucas Hernandez; N'Golo Kante, Paul Pogba; Kylian Mbappe, Antoine Griezmann, Blaise Matuidi; Olivier Giroud.

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionLee etu ndị mmadụ si atapị akụkọ egwuregwu bọọlụ