World Cup 2018: France ebuliela Iko Mbaụwa 2018

Frans ebuliela Iko Mbaụwa 2018 Image copyright Getty Images

Frans ebuliela Iko Mbaụwa nke afọ 2018 ka ha ji 4-2 merie Kroeshia.

Onyeisi FIFA bụ Gianni Infantino nakwa Onyeisiala Rọshịa bụ Vladimir Putin, Onyeisiala Frans bụ Emmanuel Macron nakwa Onyeisiala Kroeshia bụ Kolinda Grabar-Kitarović, so na ndị na-ekwe ndị gbara bọọlụ n'aka ma na-enye ha ihe nrite ha nwetara n'agbanyeghị na mmiri bidoro izo.

Ndị nwetara ihe nrite

Kylian Mbappe si Frans nwetara ihe nrite 'young player of the tournament', maka ịbụ onye pere mpe kachasị mee ọfụma n'asọmpi a.

Thibault Courtois bụ onye Beljiọm, nwetara ihe nrite 'golden glove' maka ịbụ ochee goolu kacha mee ọfụma n'asọmpi a.

Luka Modric bụ onye Kroeshia, nwetara ihe nrite 'golden ball' maka ịbụ onye kacha gbaa bọọlụ ọfụma n'asọmpi a.

Eden Hazard bụ onye Beljiọm bụ onye nke abụọ kacha gbaa ọfụma ebe Antoine Griezmann bụ onye Frans bụ onye nke atọ.

Harry Kane si Ịngland, nwetara ihe nrite 'golden boot' maka ịbụ onye kachasị nye goolu n'asọmpi a. O nyere goolu isii.

Ndị Frans na-atuli Deschamps elu maka ịkpọ ha gaa ma merie Iko Mbaụwa a. Nke a bụ Iko Mbaụwa abụọ ha na-ebuli.

Cheta na ha buliri ya n'afọ 1998.

Didier Deschamp bụ onye nchịkọta ha esonyela na naanị mmadụ atọ buliri Iko Mbaụwa dịka ọgbaa bọọlụ nakwa dịka onye nchịkọta.

Nkeji 90+5: Lloris aghọrọla bọọlụ Perisic gbara ka a na-egbuchi bọọlụ.

Nkeji 90+3: Pogba enwetala ohere inye goolu ọzọ, mana ọ banyeghị ya n'ụkwụ ọfụma.

Nkeji 90+2: Vsraljko enwetala akwụkwọ edo edo.

Nkeji 90: E tinyekwuola nkeji ise.

Nkeji 89: Kroeshia ebutela bọọlụ, Kramaric bunyere Rakitic gbara shọọtụ ma gbafee ya n'elu neetị.

Nkeji 86: Fekir agbaala shọọtụ na poostu Kroeshia mana Subasic ghọrọla ya.

Nkeji 82: Pjaca a ka webatara ewebata enwetala ohere inye Frans goolu ka Modric bunyere ya bọọlụ, mana ọ bataghị ya n'ụkwụ ọfụma

Nkeji 81: Frans ewepụla Giroud tinye Fekir.

Nkeji 81: Kroeshia ewepụla Strinic tinye Pjaca.

Nkeji 79: Mmehie ahụ Lloris mere e ji nye ha goolu etinyela ndị otu ya na gbagharịa.

Nkeji 77: Modric bulitere bọọlụ bunye Mandzukic, Umtiti eburu ya gbafuo mana ọ batara n'ụkwụ Kramaric bunyere ya Rakitic. Mana Rakitic gbafuru ya akụkụ poostu.

Nkeji 75: Vrsaljko nwetara ohere iji gbaa bọọlụ na poostu Frans, mana Umtiti na Varane gbochiri ya.

Nkeji 73: Frans ewepụla Matuidi tinye Tolisso.

Nkeji 71: Kroeshia ewepụla Rebic tinye Kramaric.

Nkeji 69: GOOOLLLUUU!!!! Mandzukic enyela goolu ka Lloris atụtụghị bọọlụ a gbalaara ya azụ.

Nkeji 65: GOOOOLLLLUUUU!!!! Mbappe enyela goolu. Frans na-agba 4-1.

Frans anaghị enyezi Kroeshia ohere imegharị ahụ.

Nkeji 59: GOOOOLLLLUUUU!!! Pogba agbakpuola bọọlụ na neetị.

Nkeji 55: Frans ewepụla Kante tinye N'Zonzi

Nkeji 52: Ndị nkwado amabatala n'ọgbọ egwuregwu, ogbu bọọlụ kwụsịrị bọọlụ ịchụpụ ha ezi.

Kroeshia na-acha Frans ọkụ n'ọkara a.

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Onye ga-eturu ugo n'etiti Modric na Mbappe?

Nkeji 49: Varane egbochiela Perisic imewa ha obi, ebe Lloris tinyere ahụ ya ịkụpụ bọọlụ.

Nkeji 48: Rebic ebutela bọọlụ Modric gbara, gbaa shọọtụ gara n'elu poostu mana Lloris kụpụrụ ya n'oge.

Nkeji 47: Vsarljko eburula nsogbu gaa n'ihu poostu ndị Frans, mana Lloris kụpụrụ ya.

Nkeji 46: E bidola ọkara nke abụọ. Onye ga-emeri asọmpi a ma bulie Iko nke afọ a?

A gaala ezumike nkeji 15.

Nkeji 45+2: Mandzukic na-achọ ibunye Rebic bọọlụ ka ọ gaa nye goolu, mana Lloris bu ha ụzọ nweta ya.

Ogbu bọọlụ etinyekwuola nkeji atọ

Nkeji 45: Rakitic agbabatala bọọlụ n'ihu poostu, Vid tara ya isi mana ọ banyeghị.

Nkeji 43: Pogba egbochiela bọọlụ gaara abanye na neetị ha, ka Lovren bịara igbanye goolu.

Nke a bụ egwuregwu Ikpeazụ nke Iko Mbaụwa a na-enye goolu atọ tupu a gaa ezumike nkeji 15, kemgbe nke 1974 dị n'etiti West Germany na Netherlands.

Nkeji 41: E nyela Hernandez akwụkwọ edo edo.

Nkeji 38: GOOOOLLLUUUU!!!! Griezmann enyela goolu.

Nkeji 37: Griezmann ga-agba ya bụ penariti.

Nkeji 36: Ogbu bọọlụ ekwuola na bọọlụ ahụ kụrụ Perisic n'aka ma nye Frans penariti.

Nkeji 33: France enwetala 'corner', Griezmann agbabala ya n'ihu poostu, ebe a na-achọ iji VAR mara ma ọ kụrụ Perisic n'aka n'ezie.

Nkeji 28: GOOOOLLLLUUUU!!!! Perisic enyela goolu. Kroeshia na Frans na-agba 1-1 ugbua.

Nkeji 26: E nyela Kante akwụkwọ edo edo.

Mandzukic bụ onye bụ ga-enye onwe ha goolu n'ime bọọlụ ikpeazụ nke Iko Mbaụwa.

Nkeji 23: Mbappe natara Pogba bọọlụ na-achọ ibu ya agbafu, mana Vida gbapụrụ ya bọọlụ n'ụkwụ.

Nkeji 21: Modric gbara bọọlụ ahụ, mana ọ kụrụ Vida n'isi pụọ n'elu neetị.

Nkeji 20: Modric enwetala 'free kick' ka Kante tinyeere ya ụkwụ.

Nkeji 18: GOOOOLLLUU!!! Mandzukic atakpuola goolu na neetị nke ha. Ọ tara isi a ka Griezmann gbara 'free-kick si na ada Brozovic gbaturu ya.

Nkeji 11: Kroeshia abịaghị igwu egwu, ha na-acha Frans ọkụ dị egwu.

Nkeji anọ: Perisic anapụtala onye Frans bọọlụ, gawa n'ihu poostu, mana Varane napụtara ya bọọlụ tupu Umtiti agbafuo ya.

Otu Nkeji: E bidola asọmpi ikpeazụ a n'ọgbọ egwuregwu Luzhniki.

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Didier Deschamps oge ọ bụ onye ọgba bọọlụ na ugbua ọ bụ onye nchịkọta

Didier Deschamps nwere ike ịza aha na naanị mmadụ atọ buliri Iko Mbaụwa dịka ọgbaa bọọlụ nakwa onye nchịkọta. Deschamps bụ kaptịn n'afọ 1998 oge Frans buliri Iko Mbaụwa.

Otu Frans agbanweghị ndị meriri Beljiọm n'agba ọkara-ikpeazụ, Kroeshia n'onwe ha agbanweghịkwa ndị nke ha.

Mbappe ga-abụ onye atọ pekarịchara mpe ga-eso n'asọmpi ikpeazụ nke Iko Mbaụwa, ọ tọrọ naanị Pele nke Brazil n'afọ 1958 nakwa Giuseppe Bergomi nke Itali n'afọ 1982.

Ndị nọ n'oche Frans: Prensel Kimpembe, Thomas Lemar, Ousmane Dembele, Corentin Tolisso, Steven N'Zonzi, Steve Mandanda, Adil Rami, Nabil Fekir, Djibril Sidibe, Florian Thauvin, Benjamin Mendy, Alphonse Areola.

Ndị Frans bidoro bọọlụ: Hugo Lloris; Benjamin Pavard, Raphael Varane, Samuel Umtiti, Lucas Hernandez; N'Golo Kante, Paul Pogba; Kylian Mbappe, Antoine Griezmann, Blaise Matuidi; Olivier Giroud.

Ndị nọ n'oche Kroeshia: Dominik Livakovic, Vedran Corluka, Mateo Kovacic, Andrej Kramaric, Lovre Kalinic, Tin Jedvaj, Filip Bradaric, Duje Caleta-Car, Milan Badelj, Marko Pjaca, Josip Pivaric.

Ndị Kroeshia bidoro bọọlụ: Danijel Subasic; Sime Vrsaljko, Dejan Lovren, Domagoj Vida, Ivan Strinic; Ivan Rakitic, Marcelo Brozovic; Ante Rebic, Luka Modric, Ivan Perisic; Mario Mandzukic.

Akụkọ ga-amasị gị:

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a