World Cup 2018: Anyị chọrọ ịma ihe mere e ji gbapụ Afrịka n'agba mbụ n'Iko Mbaụwa - Ndị nchịkọta

Ndị Super Eagles Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Kroeshia na Ajentina meriri Naịjirịa n'asọmpi Iko Mbaụwa 2018 na Rọshịa

Ijipt, Moroko, Tunishia, Naịjirịa na Sinigal, ga-enwe nzukọ ka ha kpaa maka ihe mere Afrịka ji pụọ n'agba nke mbụ Iko Mbaụwa 2018.

Ndị nchịkọta na ndị na-ahụ maka egwuregwu bọọlụ nke mba ise a ga-ezukọ nke otu Confederation of African Football (CAF) na Moroccan Football Federation (MFF) hibere n'obodo Rabat dị na Moroko.

Emmanuel Amunike gbabuuru Naịjirịa bọọlụ ma bụrụkwa otu n'ime ndị so rụọ ọrụ FIFA n'Iko Mbaụwa a a gbachara, kwuru sị "Ndị otu egwuregwu Afrịka wụrụ anyị n'ala n'Iko Mbaụwa a."

O ga-esokwa gaa nzukọ a ha ga-eme n'ụbọchị Sunde na Mọnde na-abịa.

Nke a bụ mbụ otu mba Afrịka agaghị eru n'agba agba mgbapụ nke asọmpi Iko Mbaụwa kemgbe afọ 1982.

Amunike kwukwara sị "ọtụtụ mmadụ chere na ndị otu egwuregwu Afrịka ga-eme ọfụma karịa etu ha si emebu mbụ, mana o meghị etu ahụ."

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Rọshịa ji 3-1 merie Ijipt n'Iko Mbaụwa 2018

"Eziokwu bụ na anyị ma na egwuregwu bọọlụ agbanweela ọfụma, ọ ga na-aga n'ihu na-agbanwe. Anyịnwa nọ Afrịka, ọ bụrụ na anyị esoghị gbanwee etu anyị si eme ihe ma chọpụta etu anyị ga-esi kwalite ndị ntorobịa anyị, anyị ga na-ebi naanị n'ebumbuche na nrọ anyị."

O kwukwara sị "anyị nwere ezigbote ọnatarachi mana ọnatarachi a na-emezighị ọfụma agaghị abara gị uru."

N'izuụka gara aga, Gianni Infantino bụ onyeisi otu FIFA kwuru sị na ndị isioche n'egwuregwu bọọlụ kpara maka etu Afrịka si pụọ n'agba nke mbụ, ma kwuo na ọ na-echegbu ha.

O kwuru sị "Ị ga-enwe chiọma ịgafe agba nke mbụ n'ụdịrị asọmpi dịka Iko Mbaụwa. Sịnịgal, Moroko na Naịjirịa na-agba bọọlụ dị mma, mana ọ bụ ya bụ nsogbu mana anyị na onyeisi CAF akpaala ya.

"Ị nweta ọganiihu n'ọgbọ egwuregwu, ị kwesịrị ime ọfụma ma ị pụkwaa n'ọgbọ egwuregwu, ọ dịkwa mkpa na anyị na ndị egwuregwu bọọlụ Afrịka rụkọrọ ọnụ iji hụ na ihe niile na-aga nke ọma."

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a