Women's World Cup 2019: Super Falcons ka Super Eagles agbata ihe na bọọlụ
Women's World Cup 2019: Super Falcons ka Super Eagles agbata ihe na bọọlụ
Ndị ntaakụkọ n'egwurgwu bọọlụ bụkwa ụmụnwaanyị ekwuola na Super Falcons nke Naịjirịa ka agbata ihe na bọọlụ karịa ndị ogbo ha ndị nwoke.
Ha kwuru n'agbanyeghi nke a na ndị mmadụ karịsịa ụmụnwoke a naghị etinye uche na bọọlụ ụmụnwaanyị na Najirịa nakwa Afrịka.
Ha gara n'ihu kwuo na gọọmentị a naghị etinye uche nakwa ego n'egwuregwu bọọlụ ụmụnwaanyị dịka ha si eme na nke ụmụnwoke agbanyeghi na ụmụnwaanyị na-ebute Iko karịa ndị nwoke.
Na ọ bụ ihe ndị a mere anaghị anụ akụkọ banyere asọmpi dị iche iche ụmụnwaanyị na-agba na Naịjrịa.