Premier League: Manchester United ji 2-1 merie Leicester City n'egwuregwu nke mbụ

Ndidi na Pogba Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Nwaafọ Igbo bụ Ndidi Wilfred na Paul Pogba na-azọ bọọlụ

Iji bido afọ ọhụrụ Premier League nke 2018/2019, otu Manchester United gbara Leicester City 2-1 ka ha sukọrọ mpi.

Na-erughị nkeji abụọ e ji bido egwuregwu bọọlụ a, Man Utd ji penariti nye goolu ka onye Leicester City bụ Daniel Amartey tinyere aka ya na bọọlụ Alexis Sanchez gbara.

Paul Pogba gbakara neetị iji mee ka ọ bụrụ goolu mbụ a na-enye n'asọmpi Premier League nke afọ a.

Ka ha gbara ihe ha gbara, Luke Shaw gbanyere goolu abụọ nke Man Utd na-enweta n'abalị ahụ.

O nyere goolu a n'ime nkeji 82 nke ọkara nke abụọ.

Ka o ruru nkeji 90 egwuregwu a kwesịrị ịgwụ, e tinyekwuru nkeji anọ, nke kpalitere mmụọ ndị Leicester City ma nye ha ohere inye otu goolu ha nyere.

Jamie Vardy gbakara neetị na nkeji 90+2, ka o ji isi tiba bọọlụ biri n'igwe poostu dapụta.

Onye nchịkọta otu Man Utd bụ Jose Mourinho nwere aṅụrị ka ha meriri egwuregwu nke mbụ ha na mbido afọ ọhụrụ a.

Akụkọ ga-amasị gị