Liverpool nyụrụ West Ham anya ka Manchester City gosiri Arsenal nkarị

Ebe foto si, Getty Images
Mohamed Salah nyerela Liverpool goolu 44 n'afọ 2017/2018
Arsenal ji mmeri e meriri ha bido afọ ọhụrụ Premier League ka Manchester ji 2-0 merie ha na be ha.
Raheem Sterling bu ụzọ nyere Manchester City goolu ka ọ gbanyere goolu na nkeji 14, tupu Bernado Silva e mezuo ya abụọ na nkeji 64.
N'ime egwuregwu nke mbụ a gbara, Liverpool gwọrọ West Ham ka abacha ka ha ji 4-0 merie ha.
Mohamed Salah bu ụzọ nye goolu na nkeji 19 tupu Sadio Mane agbanye goolu abụọ na nkeji 45+2 nakwa nkeji 53.
Daniel Sturridge mezuru ya anọ na nkeji 88.
Lee ihe a gbatara na bọọlụ niile a gbara na Premier League n'izu a.
Southampton 0 - 0 Burnley
Huddersfield Town 0 - 3 Chelsea
Man Utd 2 - 1 Leicester City
Newcastle United 1 - 2 Tottenham Hotspur
AFC Bournemouth 2 - 0 Cardiff City
'Fulham 0 - 2 Crystal Palace
Watford 2 - 0 Brighton & Hove Albion
Wolverhampton Wanderers 2 - 2 Everton