Ihe a gbatara na Premier League: Arsenal enwetala mmeri mbụ ha n'okpuru Unai Emery

Arsenal na-aṅụrị Image copyright Reuters
Nkenke aha onyonyo Mmeri Arsenal bịara ka Manchester City na Chelsea merichara ha n'egwuregwu ha ji bido afọ a

Arsenal nwetara mmeri mbụ ha kemgbe Unai Emery bidoro ịchịkọta ha, ebe mmeri Liverpool meriri Brighton mere ka ha were pọintị abụọ na-aga ndị na-esote ha n'elu tebulu Premier League.

E nyere Richarlison na-agba Everton bọolụ akwụkwọ ọbara ọbara ma chụpụ ya ka ha na Bournemouth gbara onye laba onye laba (2-2).

A chụpụkwara Adam Smith bụ onye Bournemouth, nke pụtara na ha na Everton ezughị ezu wee gbachaa egwuregwu nke taa.

Leicester City n'onwe ha meriri Southampton (2-1), ebe a chụpụrụ Pierre-Emile Hojbjerg na-agbara Southampton ka ọ natara akwụkwọ edo edo abụọ.

Enweghị onye meriri ibe ya n'etiti Huddersfield na Cardiff, n'agbanyeghị na a chụpụrụ otu onye Huddersfield (0-0).

Ndị Wolverhampton mere Manchester City bụ ndị buliri iko Premier League n'afọ gara aga ihe tụrụ ha n'anya taa ka ha na ha gbara onye laba onye laba (1-1).

Akụkọ ga-amasị gị: