Liverpool aghọọla 'sọ m bụ eze ga-akwụ ọtọ'?

Georginio Wijnaldum Image copyright AFP
Nkenke aha onyonyo Georginio Wijnaldum ji isi nye goolu mbu ya na Premier League

Goolu si n'aka onye egwu ,Georginio Wijnaldum nakwa Roberto Firmino bụ ọkpụ abụọ nyere otu egwu Liverpool mmeri taa bụ Satọde.

Tottenham ji goolu si n'aka Erik Lamela, onye egwu ha nyere nke mere ka Liverpool nwetụ obi mmapụ n'agba nke abụọ asompi saa otu ọkpụ.

Mmeri a mere ya nke ise e sepụghị aka Liverpool na-enwe mmeri n'asompi Premier League afọ a ka a ga-akpọzi ha 'Sọmụbụezegaakwụọtọ.'

Chi ka bụ ụtụtụ na Premier League afọ a, mana mmeri ha nke a mere n'ama egwuregwu Wembley bụ ebe a nọrọ kụọ ha isiabaokpu dịka a gbara ha ọkpụ anọ a satara otu n'afọ gara aga bụ ọpụrụiche.

Anya otu Liverpool dị n'ibu iko asompi Premier League site nke ha gosiri site n'ịzụ oche goolu Alisson n'aka ndị Roma nde paụnds 68( £67m), onye na-echekwa bọọlu bụ Virgil van Dijk, onye ha zụrụ nde paụnds 75(£75m).

Ha zụkwara Keita, Fabinho and Xherdan Shaqiri.

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Harry Kane nkeTottenham gbalírí inye fe bóólú naaní úgboro 13 na-amítaghí mkpúrú

Ha niile kpara ike na-egosi na Liverpool nwereike kụpụ Manchester bụ dịke na-achị ugbua na Premier League.

Onye nchịkọta ha bụ Jurgen Klopp gwara BBC sị, "Ụmụ okoro m kpara ike n'ezie. Tottenham so n'otu egwuregwu kachasi mma n'egwuregwu bọọlụ, ya mere, anaghị akpọ ihe mere ebe a obere ihe."

Ọ gara n'ihu sị, " Anyị kpara ike n'ihu, kpaa n'azụ. Ike anyị kere karịrị mmerị anyị mmeriri . Ya mere o nweghị ihe m ga-akatọ n'ihe anyị mere."

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Isiokwu Ndị Emetụtara