Leicester City: Ụgbọelu Helikọpta onye nwe ya akpọriela

Anya hụrụ ka oihe ji mee sị na ọ bụ akụpe ọdụ ụgbọelu kwụsiri ịrụ ọrụ mere o ji kpọkasịa. Image copyright LIAM HOPKIN/@HOPKIN_LIAM
Nkenke aha onyonyo Anya hụrụ ka ihe si mee sị na ọ bụ akụpe ọdụ ụgbọelu kwụsiri ịrụ ọrụ mere o ji kpọkasịa.

Ụgbọelu Helikọpta onye nwe otu egwuregwu bọọlụ Leicester City akpọkasịala dịka ọ na-achọ i si n'ọgbọ egwuregwu ha efepu ụnyaahụ.

Akụkọ kwuru na Vichai Srivaddhanaprabha bụ onye nwe otu bọọlụ Leicester City nọ n'ime ụgbọelu ahụ mgbe ọ dara n'ala.

Leicester City bụ ebe ụmụ Naịjirịa abụọ bụ Kelechi Iheanacho na Ndidi na-agba bọọlụ gbachara asọmpi ha na ndị West Ham United tupu nke a e mee.

Amabeghi mmadụ ole ọzọ nọ n'ime ụgbọelu helikọpta ahụ mgbe nke a mere.

Anya hụrụ ka ihe ji mee sị na akụpe ọdụ ụgbọelu helikọpta ahụ kwụsiri ịrụ ọrụ nke mere o ji kpọkasịa.

Onye ọzọ hụrụ ya kwuru na injini helikọpta ahụ kwụsiri ịrụ ọrụ tupu o si n'elu daa.

Image copyright PA
Nkenke aha onyonyo Vichai Srivaddhanaprabha goro Leicester City n'afọ 2010 eruo n'afọ 2016 ha mabute Iko Premier League.

Vichai Srivaddhanaprabha goro Leicester City n'afọ 2010 mana e rue n'afọ 2016 ha mabute Iko asọmpi Premier.

Ọtụtụ ndị mmadụ gụnyere otu Manchester City na-ezigara ha ozi nkasi obi.

Ndị ọzọ na-ezigara ha ifuru.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: