BBC African Footballer of the Year 2018: Aha ndị a họrọ

Medhi Benatia (Morocco), Kalidou Koulibaly (Senegal), Sadio Mane (Senegal), Thomas Partey (Ghana) and Mohamed Salah (Egypt) Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Medhi Benatia, Kalidou Koulibaly, Sadio Mane, Thomas Partey na Mohamed Salah (site n'aka ekpe rue n'aka nri) bụ ndị a họpụtara.

E kwupụtala aha mmadụ ise a họpụtara maka nturuugo ọkacha agba bọọlụ n'Afrịka 2018.

N'afọ a, ndị a họpụtara gụnyere Medhi Benatia (Morocco), Kalidou Koulibaly (Senegal), Sadio Mane (Senegal), Thomas Partey (Ghana) na Mohamed Salah (Egypt).

Ntuliaka ga-amalite n'abalị iri na asaa nke ọnwa Nọvemba, n'elekere asatọ nke abalị ma mechie n'abalị abụọ ọnwa Disemba, n'elekere iri abụọ na otu.

A ga-ekwupụta onye meriri n'emume BBC World News n'ụbọchị iri na anọ ọnwa Disemba, ma o were ọkara gafee elekere ise nke uhuruchi.

Ọ bụ ndị ọkacha n'akụkọ egwuregwu bọọlụ n'Afrịka họpụtara aha ndị a.

Onye na-agbara Liverpool bọọlụ bụ Salah mabutere nturuugo a n'afọ gara aga.

Ndị ọzọ mabutere ya na mbụ bụ Jay-Jay Okocha, Michael Essien, Didier Drogba, Yaya Toure na Riyad Mahrez.

Ndị na-ama aka

Onye na-agbara Juventus bọọlụ bụ Benatia, dị afọ iri atọ na otu, mabutere iko nke anọ ya n'otu usoro n'afọ a - abụọ n'otu Bayern Munich na abụọ n'otu Juventus ma duru Morocco gaa asọmpi Iko Mbaụwa nke afọ a.

Onye na-agbara Napoli bọọlụ bụ Koulibaly, dị afọ iri abụọ na asaa, gbara mbọ n'otu ya na ndọrọ ndọrọ ha na Juventus maka Iko Serie A, tinyere mmeri ha mere ndị mabutere Iko ahụ. Ọ gbachara asọmpi na nkeji dị narị abụọ na iri asaa ndị Senegal gbara n'asọmpi Iko Mbaụwa.

Onye na-agbara Liverpool bọọlụ bụ Mane,dị afọ iri abụọ na isii, gbakwara asọmpi niile Senegal gbara n'Iko Mbaụwa, ma nyekwa ndị Japan ọkpụ goolu abụọ. O so na ndị kachasị enye goolu n'asọmpi Uefa Champịọns gara aga - site n'inyere Liverpool goolu iri, nke gụnyere abụọ o nyere n'asọmpi agba ikpeazụ ha na Real madrid gbara.

Onye na-agbara Atletico Madrid bọọlụ bụ Partey, dị afọ iri abụọ na ise, guzobere onwe ya dịka onye so n'otu mbụ nke Diego Simeone, tinyere mwebata ya na mmeri ha meriri ndị Marseille n'agba ikpeazụ nke asọmpi Europa. O nyere goolu n'asọmpi ndị Ghana na Japan nakwa nke ha na ndị Iceland.

Onye na-agbara Liverpool bọọlụ bụ Salah,dị afọ iri abụọ na isii, o turuugo dịka ọkachas enye goolu n'asọmpi Inglish Premier site n'inye goolu iri atọ na abụọ n'ọnwa Mee, dịka Mane, o nyere goolu iri n'asọmpi Uefa Champịọns dịka ha ruru agba ikpeazụ. O nyere goolu niile ndị Ijipt nwetere n'asọmpi Iko Mbaụwa - nke bụ pasentị iri anọ n'asọmpị ha niile n'Iko Mbaụwa.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a

Njikọ Ịntanetị ndị emetụtara

BBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị Ịntanetị ndị dị na mpụga