Jose Mourinho: Zinedine Zidane na mmadụ atọ ndị a e nwere ike ịnọchi ya?

Mourinho Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Onye ga-anọchi Mourinho ugbua?

Onye nwere ike ịnọchi anya Jose Mourinho ugbua Manchester United chụrụ ya?

N'agbanyeghị na Mourinho chịkọtara ha afọ abụọ na ụma, obi dị ọtụtụ ndị na-akwado Man Utd anụrị na a chụrụ ya, mere ka ha jiri aka ha na-akpọpụta aha ndị ha chọrọ ka ha nọchie ya.

Mana otu Man Utd sị ndị mmadụ cheretụ, na ha ga-ahọpụta onye ga na-elekọta otu ha ruo ngwụcha afọ bọọlụ a, tupu ha achọta onye ọ ga-abụzị ọrụ ya ịchịkọta ha.

Lee aha mmadụ ole Man Utd nwere ike iwe n'ọrụ dịka onye nchịkọta ha na ngwụcha afọ bọọlụ a.

1) Zinedine Zidane

Zidane dị afọ 46 e ji "Zizou" mara, so n'ime ndị a na-ahụ ka "dike" n'egwuregwu bọọlụ.

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Zidane enweghị ebe ọ na-achịkọta ugbua. Ọ bụ ya ga-ewe ọrụ a?

Ọ bụrụla onye nchịkọta bọọlụ ugbua, ka ọ gbachara bọọlụ ihe karịrị afọ iri atọ na asaa.

Dịka onye nchịkọta, ọ chịkọtara otu Real Madrid nke obere site na 2014 ruo 2016 na nke nnukwu site na 2016 ruo 2018.

Dịka onye nchịkọta Real Madrid, o buliri iko Uefa Champions League ugboro abụọ, bulie nke La Liga otu oge, bulie Uefa Super Cup ugboro abụọ, otu nke Supercopa de España nakwa nke FIFA Club World Cup ugboro abụọ.

2) Michael Carrick

Carrick dị afọ 37, bụ otu onye ma maka Man Utd ọfụma; ọ nọola ebe a hụ dịka onye egwu nakwa onye nchịkọta.

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Carrick so Man Utd bulie iko iri na asatọ

Ọ gbaara Man Utd bọọlụ afọ iri na abụọ, site na 2006 ruo 2018; ọ nọ ya oge Alex Ferguson, David Moyes na Louis Van Gaal.

Ka ọ kwụsịrị ịgba bọọlụ, Mourinho kpọrọla ya mee ya otu n'ime osote ya.

3) Antonio Conte

Conte dị afọ 49, achịkọtala otu egwuregwu dị ka Juventus, Atalanta nakwa Chelsea.

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Conte arụbeghị ọrụ onye nchịkọta kemgbe ọ pụrụ na Chelsea

Ọ bụkwa otu onye gbachara bọọlụ banye ọrụ nchịkọta.

N'agbanyeghị na Chelsea mechara chụọ ya n'ọrụ n'ọnwa Julaị 2018, Conte buteere ha otu iko Premier League na otu iko FA.

4) Mauricio Pochettino

Pochettinho dị afọ 46, achịkọtala otu dị ka Espanyol, Southampton na Tottenham.

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Pochettino achịkọtala Tottenham site n'afọ 2014 ruo ugbua

Ọ gbakwara bọọlụ n'otu dịka PSG na Espanyol tupu ọ banye ọrụ nchịkọta.

Dịka onye nchịkọta, o nwetala ihe nrite "onye nchịkọta kachasị mee ọfụma" na Premier League ugboro anọ.

Onye ka ọ dị gị ka ọ ga-aka mee ọfụma ma a họrọ ya?