Man City: Ugboro ole ndị egwuregwu bọọlụ ji nkata kporo goolu ka Burton

Ndị egwuregwu ji nkata kporo goolu Image copyright Getty Images

Ị bụ onye egwuregwu bọọlụ na-amasị? Ị ma ugboro ole ndị mmadụ jirila goolu gbawaa ndị ha zutere n'asọmpi afọ?

Goolu itoolu asataghị otu Manchester City ji merie Burton Albion ka ha zutere n'asọmpi Iko Carabao ụbọchị Jenụwarị 9, 2019, mere ka ha bụrụ isiokwu wuru ewu.

Ha wuru makana ọ bụ mbụ a na-enyeru ọkpụ goolu a n'asọmpi a kemgbe Liverpool ji goolu 10 asataghị otu merie Fulham n'afọ 1986.

Ọ bụkwa mbụ a na-enyeru ọkpụ goolu ruru ole ahụ n'ime agba ọkara-ikpeazụ asọmpi iko a, kemgbe afọ 1967.

Mana ọ bụghị mbụ ha na-enye goolu gafere ise n'ime otu egwuregwu, ha mere ya n'ụbọchị Jenụwarị 6, 2019, ka ha ji goolu asaa merie Rotherham United n'asọmpi Iko FA.

Ha mekwara ya ka ha ji goolu iri asataghị otu merie Huddersfield Town n'afọ 1987.

Ikpeazụ e mere ụdịrị ihe a bụ oge Leeds United mere ya n'ọnwa Ọktoba 1967.

Ugboro ole ndị ọzọ e nyerela ihe karịrị goolu ise n'otu egwuregwu:

Egwuregwu bọolụ ebidoghi taa, nke bụ na a sị ka amalite ịgụ ugboro ole ebunyere ndị mmadụ goolu, ọ ga-abụ atụrụ tawa.

Mana, lee ugboro ole emere ndị mmadụ echeta ebewe n'ime afọ iri abụọ gara aga:

  • 1) N'afọ 2001, mba Ọstrelia ji "ụgbọala" buru goolu bunye ndị mba Amerịkan Samoa.
Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Ọtụtụ ndị so gbaara Samoa bọọlụ bụ ụmụaka ọ bụ mbụ ha na-agba nnukwu asọmpi

N'egwuregwu ahụ, ndị ogbu bọọlụ kwuru na ha ma na ọ bụ eziokwu na ndị Ọstrelia karịrị Samoa; nkarị a gosiri makana ha gbara ha ọkpụ 31 asataghị otu.

Otu onye nyechara goolu 13 naanị ya, onye ọzọ nyere asatọ naanị ya.

  • 2) N'ime afọ 2016, o wuru ewu na otu egwuregwu ụmụnwaanyị a ma dịka RNAS Culdrose ji goolu nyebaa ndị Helston afọ ka ha zutere.

Dịka ndị ụlọ ntaakụkọ Mirror Online si dee ya, ha nyere goolu 40 asataghị otu n'ime otu egwuregwu ahụ.

  • 3) N'ọnwa Epreelụ 2018, otu egwuregwu bọolụ ụmụnwaanyị Frans ji nkata bunye otu ụmụnwaanyị Naịjirịa goolu asatọ asataghị otu.
Image copyright Getty Images

N'agbanyeghi na ọ bụ asọmpi enyi na enyi, Frans jụrụ imere Naịjirịa ebere ka ha na-agbari ha.

  • 4) N'afọ 2005, otu egwuregwu mba Ịngland gbara mba Họngarị ọkpụ 13 asataghị otu.

Ọ dị ka ọ bụ n'asọmpi ụmụnwaanyị ka a na-aka ekpo goolu ka a na-anwụ anwụ.

Otu egwuregwu ụmụnwaanyị Ịngland jikwa ọkpụ goolu 10 merie mba Mọntenegro n'afọ 2014.

Ndị ọzọ bụ mgbe Jamini wụrụ Brazịl ọkpụ asaa ha satara naanị otu n'asọmpi Iko Mbaụwa Brazịl hibere n'ụlọ ha n'afọ 2014.

Image copyright Getty Images

Abịa n'otu egwuregwu ndị nọ n'Ịngland, ha na-awụnye ya ka a na-anwụ anwụ.

  • N'afọ 2010, Chelsea gbara Wigan ọkpụ goolu asatọ asataghị otu, ha gbakwara Stoke City ọkpụ asaa ha gba aka lawa, gbakwa Aston Villa ọkpụ asaa asatara otu (ha gbakwara ha asatọ a sataghị otu na 2012) nakwa Sunderland ọkpụ asaa asatara abụọ.
  • N'afọ 2009, Tottenham ji ọkpụ goolu itoolu wụzuo Wigan ahụ, n'agbanyeghị na ha satara otu.
  • N'afọ 2009, Middlesbrough ji nkata bunye Manchester City ọkpụ goolu asatọ ha satara naanị otu.
  • N'afọ 2004/2005, Arsenal jiọkpụ goolu asaa a na-asataghị ihe ọbụla menyụọ ma Everton ma Middlesbrough anya, na 2012 ọ bụ Newcastle ka ha ketere ma wụọ ha goolu asaa ha sara atọ
  • N'afọ 1999, Manchester United gbara Nottingham Forest ọkpụ itoolu asatara otu. Na 2010 ha gbara Blackburn Rovers ọkpụ asaa a satara naanị otu, ma gbakwaa Arsenal ọkpụ asatọ asatara naanị abụọ n'afọ 2011

Akụkọ ga-amasị gị: