Manchester United anyụọla Tottenham nsị n'isi

David de Gea Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo David de Gea mere nke a site n'igbochi bọọlụ ịgafe ya ugboro iri na otu, ọ bụ nke oji ma aka ma ụkwụ mee.

David de Gea bụ onye na-echere Manchester United bọọlụ ezila na ọ bụ aka gọm n'iche bọọlụ.

Manchester United gosiri Tottenham nkarị n'iji otu ọkpu goolu merie ha n'ime asọmpi agbara n'etiti otu egwuregwu abụọ ndị a n'ụbọchị Sọnde.

Marcus Rashford nyere goolu ha ji merie n'ime nkeji iri anọ na anọ site na bọọlụ Paul Pogba gbaara ya.

Agbanyeghi nke a, onye kachasị gbapụta ihe n'asọmpi a bụ David de Gea, bụ onye na-echere Manchester United bọọlụ.

Image copyright Getty Images

De Gea mere nke a site n'igbochi bọọlụ ịgafe ya ugboro iri na otu, bụ nke oji ma aka ma ụkwụ ya mee.

David de Gea gbawara ndị Tottenham obi site n'igbochi bọọlụ Harry Kane ọtụtụ oge nakwa nke Dele Alli na Alderweired.

Nke a mere Manchester United na Arsenal ji nwere otu ọnụọgụgụ na tebụlụ bụ iri anọ na otu ebe Tottenham nọ n'ọnụọgụgụ iri anọ na asatọ.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: