Emiliano Sala: Ugboro ole ndị egwuregwu nwụrụ ka ọnwa ha na-achake

Emiliano Sala Image copyright Getty Images

Ọnwụ gburu Emiliano Sala n'ime oge ọ dị ka ọnwa ya achakeela, abụghị mbụ ndị na-akwado egwuregwu na-abanye n'iru uju maka ụdịrị ihe mberede a.

A chọtara ozu Sala n'ụbọchị asatọ nke ọnwa Febrụwarị 2019, n'ime ụgbọelu ọ kpọkasịrị n'ime ya ka o si na mba Frans na-alọghachị Ịngland.

Ọ ka binyechara aka n'akụkwọ ga-eme ka ọ malite ịgbara otu Cardiff City bọọlụ.

BBC Igbo chọrọ ịkpọpụta ugboro ole "dara ụda" ndị egwuregwu bọọlụ nwụrụ "n'ụtụtụ" ha.

1) Sam Okwaraji:

Okwaraji bụ nwaafọ Igbo nọchitere anya Naịjirịa n'ọgbọegwuregwu ma na-agbara SSV Ulm dị na mba Jamani bọọlụ oge ọ nwụrụ.

Ọ nwụrụ ụbọchị iri na abụọ nke ọnwa Ọgọst nke afọ 1989, ka ọ dị naanị afọ 25.

Obi koropuru ya ka ọ fọrọ naanị nkeji iri tupu e gbuchie bọolụ n'etiti Naịjirịa na Angola na Legọs.

Na nyocha a na-eme ozu tupu e lie ya, a chọpụtara na o nwere ọbara mgbalielu ma hụkwa na obi ya koro eko.

2) Patrick Ekeng:

Image copyright Getty Images

Ekeng bụ onye mba Kamerun so ha gbaa bọọlụ n'Iko Mba Afrịka nke 2015, nwụrụ n'ụbọchị isii nke ọnwa Mee 2016, ka ọ dị naanị afọ 26.

Akụkọ kwuru na obi nkoropu gburu ya ka e bugara ya ụlọọgwụ ka ọ dachara n'ọgbọegwurwegwu.

Ọ na-agbara ndị otu Dinamo București dị na mba Romenia bọọlụ oge ọ nwụrụ.

3) Cheick Tioté:

Image copyright Getty Images

Tioté bụ onye mba Aịvorị kost a ma ama, nwụrụ ka ọ dị naanị afọ 30.

Ọ nwụrụ ụbọchị ise nke ọnwa Juun 2017, ka obi koropuru ya ebe ọ na-eme njike bọọlụ na mba Chaịna.

Ọ na-agbara ndị otu Beijing Enterprises bọọlụ oge ọ nwụrụ.

4) Marc-Vivien Foé:

Image copyright Getty Images

Foé bụ onye mba Kamerun, nwụrụ n'ụbọchị iri abụọ na isii nke ọnwa Juun 2003, ka ọ dị naanị afọ 28.

Ọ nwụrụ n'ọgbọegwuregwu ka Kamerun na Kolombịa zutere n'asọmpi Fifa Confederations Cup.

Ọ dara n'ala n'ime nkeji 76 e ji agba bọọlụ, e nyere ya nleta gbatagbata mana o zughi ịzọ ya ndụ.

Makana ọ nwụrụ n'ụlọọgwụ dị n'ọgbọegwuregwu.

A chọpụtara na ọrịa obi gburu ya.

5) Davide Astori:

Image copyright Getty Images

Astori bụ onye mba Itali nwụrụ n'ụbọchị anọ nke ọnwa Maachị 2018, ka ọ dị naanị afọ iri atọ na otu.

Ọ nwụrụ n'ụra ka obi koropuru ya, n'ụlọoriri ebe ya na ndị otu egwuregwu ibe ya nọ.

Ọ nwụrụ chi foro ụbọchị ndị otu ya bụ Fiorentina na ndị Udinese kwesịrị izute.

6) Olubayo Adefemi:

Adefemi nọchitere anya Naịjirịa n'asọmpi Olimpiks nke afọ 2008 nakwa asọmpi Iko Mba Ụwa nke ndị obere a gbara n'afọ 2005.

Ọ nwụrụ n'ụbọchị iri na asatọ nke ọnwa Epreelụ 2011, ka ọ dị naanị afọ 25.

Ọ nwụrụ n'ihe mberede okporoụzọ na mba Gris, ka ọ na-akwado ịlọta Naịjirịa maka agbamakwụkwọ ya.

Ndị egwuregwu Naịjirịa ọzọ nwụrụ n'ụdịrị ọnọdụ a:

  • David Oniya: Ọ nwụrụ ụbọchị iri na atọ nke ọnwa Juun 2015, ka obi koropuru ya n'ọgbọegwuregwu na mba Maleshia. Ọ dị naanị afọ 30.
  • Emmanuel Ogoli: Ọ nwụrụ n'ụlọọgwụ ụbọchị iri na abụọ nke ọnwa Disemba 2010, ka ọ dachara n'ọgbọegwuregwu. Ọ dị naanị afọ 21.
  • Abel Tador: Ọ nwụrụ ụbọchị iri na anọ nke ọnwa Juun 2009 ka ndị ohi gbagburu ya. Ọ dị naanị afọ 24.
  • Echendu Adiele: Ọ nwụrụ ụbọchị iri na asatọ nke ọnwa Juun 2011, ka ọ na-arahụ ụra ka ọ dị afọ 32. A na-ekwu na nsị e nyere ya gburu ya.

Akụkọ ga-amasị gị: