Man City vs Chelsea: A gwọọla Chelsea ka abacha

Aguero na Bakayoko Image copyright Getty Images

Man City ji ọkpụ goolu isii asataghị otu merie Chelsea na be ha n'Etihad taa.

Raheem Sterling bu ụzọ gbakaa neetị ndị Chelsea, tupu Sergio Kun Aguero abịa gosi ha nke tọrọ fada.

Man City gosiri Chelsea na ha anaghị achị ka ha nyere goolu anọ n'ime nkeji 25 e ji malite ịgba bọolụ.

Aguero mechara nyezuo goolu atọ nke Bekee kpọrọ "hattrick", ebe Sterling nyere abụọ, ebe İlkay Gündoğan nyere otu.

Ikpeazụ e ji goolu anọ merie Chelsea n'egwuregwu na Premier League, bụ n'afọ 1996, mana o meela ha ugboro abụọ.

Ihe ndị mmadụ na-ekwu maka ya:

@Gracey1671 kwuru na e kwesịrị iji maka ụdịrị mmeri a chụọ Sarri n'ọkwa onye nchịkọta.

@Etor_Reigns kwuru na ọ ma na isi agaghị apụta Chelsea site n'oge e nyere goolu nke mbụ.

@Andre02074138 kwuru sị na ọ dịkwa ka a ga-ebunye Man City iko Carabao karịa ịhapụ ka ha na Chelsea zukọọ n'ụbọchị 24 nke ọnwa Febrụwarị a.

@_aquosua_ ji foto gosi etu e si wụọ Chelsea n'ala.

@Bimpsy sị na iwe ya bụ na ejighi goolu sụpee aha Chelsea.

Akụkọ ga-amasị gị