Man United vs Liverpool: Ha agbọghị ụja, ha ataghị arụ

Pogba na Salah Image copyright Getty Images

Liverpool gara zute Manchester United na be ha bụ Old Trafford ebe ha kụkọtara isi ka ebule abụọ na-alụ ọgụ.

Ruo oge e gbuchiri bọọlụ, enweghi onye nyere goolu n'etiti ha abụọ, n'agbanyeghi na a gụfuru goolu Chris Smalling gbakpuru na neetị makana o bi ebi na nso poostu.

N'ime ọkara iri abụọ e ji bido bọọlụ, Man Utd gbanwere ndị nke ha bụ Juan Mata nakwa Ander Herrera, maka mmerụahụ.

Ka Herrera pụrụ, e ji Andreas Pereira tichie ya, ma werekwa Jesse Lingard tichie Mata mgbe ọ pụrụ.

N'otu aka ahụ, Liverpool gbanwekwara Roberto Firminho maka mmerụahụ ma kpọbata Daniel Sturridge iji tichie ya.

Na nkeji iri anọ, Lingard riri 'nri Chinyere' Romelu Lukaku bunyere ya, ka Alisson Becker ghọrọla ya n'aka ya.

Image copyright Getty Images

Isi Solskjaer ọ ga-apụtakwa taa?

Na-erughi nkeji 17ọ batara na nkeji abụọ Lingard richara goolu n'ihu poostu, ọ pụrụ n'ọgbọ egwuregwu maka mmerụahụ; nke bụ na Man Utd agbanwechaala mmadụ atọ ha nwere.

E webatara Alexis Sanchez iji gbanwee ya.

Ọzọ bụ na Liverpool ejiela bọọlụ ihe ruru pasentị iri isii, ebe Man Utd ji ya pasentị iri anọ.

Gịnị ga-eme ma Liverpool chakee?

N'ọkara abụọ, Liverpool wepụrụ Jordan Henderson, were Xherdan Shaqiri tichie ya; nke a wutere ya, ọ gwara Klopp bụ onye nchịkọta ha ihe anyị anụghị iji gosi na obi adịghị ya mma.

Ewepụrụ Salah bụ onye egwu Liverpool na nkeji 78 makana agha a riri ya, ma webata Divock Origi.