Dynamo Kyiv vs Chelsea: E jirila nkata goolu dulaa Dynamo Kyiv

Chelsea Image copyright Getty Images

Chelsea gosiri na ha bụ dike ọgụ n'agha ka ha tiri Dynamo Kyiv egwu ka ha abụ nwunye ha lụrụ ọhụrụ.

Ndị Dynamo Kyiv achịtaghị aja makana ndị Chelsea enyeghi ha ohere ịṅụ mmiri tọgbọ iko.

Giroud shikashịrị ka onye tetara n'ụra ma nye goolu atọ.

Chelsea nọ na-awụju goolu ka ọ bụ nkwado egwuregwu ka bịara, mere na goolu nke mbụ banyere na nkeji 5 e ji malite bọọlụ; oge Olivier Giroud tinyere goolu na neetị oge Willian gbara kọna.

Giroud mechara nye goolu atọ n'ime otu egwuregwu a kpọro "hattrick", gbakpuru nke abụọ ya na nkeji 33 ma were isi takpuo nke atọ na 59, ebe Marco Alonso nyere nke ya na nkeji 45 na ụma, Callum Hudson-Odoi mechiri akwụkwọ ka ọ gbabara nke ya na nkeji 78.

Image copyright Getty Images

Serhiy Sydorchuk bụ onye ndu ndị Kyiv nwara ike ya ọzọ ka Arrizabalaga chechara goolu ya na nkeji 51, mana ọ kụrụ n'igwe poostu.

Chelsea ga-amata onye ha ga-ezute n'agba anọ-ikpeazụ, n'ụbọchị 15 nke Maachị.

Akụkọ ga-amasị gị:

Isiokwu Ndị Emetụtara