FA Cup: Man City egwukpọọla Swansea anya

Aguero Image copyright Getty Images

Aha Man City gaara abụ "ndo" taa dịka Swansea malitere ikpa ike n'oge, mana egwu mechara dagharịa n'ọkara abụọ oge ha zụtara ihe a tụrụ ha n'ahịa.

Ihe mgbu Man City malitere ka Swansea wụrụ ha goolu abụọ n'ime naanị nkeji 30 e ji bido ịgba bọọlụ.

Matt Grimes ji penariti gbakpuo goolu mbụ ndị Swansea n'ime nkeji 20, ebe Bersant Celina gbabuuru Man City bọọlụ ji ibu kara aka gbakaa neetị ndị bụbu ọga ya, iji mee ka Swansea nweta goolu ha nke abụọ na nkeji 29.

Ọkara abụọ mgbe egwu dagharịrị

Mbata Sergio Aguero na Raheem Sterling mere ka ndị Man City dị ka ndị a kpọlitere n'ụra ọnwụ, nke mere ka ha chakesia chọwa ihu poostu ka a na-anwụ anwụ.

Man City mechara gbaa aka ahịa ka Bernardo Silva gbakpuru bọọlụ na neetị na nkeji 69.

Kristoffer Nordfeldt bụ ochegoolu Swansea tibara bọọlụ na poostu ya ka Aguero gbara penariti biri na poostu, nke pụtara goolu abụọ Man City nwetara.

Ọdịda Sterling dara iji nweta ya bụ penariti, bụ ihe a nọ na-enyo enyo maka na o yiri aka enwe bara n'ofe.

Na nkeji 88, Aguero bụ "dibia afa" ndị Man City gbakpuru goolu mere ka e were ntu kụchie igbe olileanya ọbụla ndị Swansea nwere igafe agba nke isii a; e nyokwara goolu nke a enyo makana ọ dịka wuruwuru ọ banyere na ya.

Etu ọ dị ugbua, Man City ka na-atụ anya ibuli iko ụzọ anọ (Champions League, Premier League na FA Cup); cheta na ha ebuliela iko Carabao nke afọ a.

Akụkọ ga-amasị gị:

Isiokwu Ndị Emetụtara