FA Cup: Wolves agwọọla Man Utd ara

Man Utd Image copyright Getty Images

Ka ọ dị ugbua, Wolverhampton ga-eso gbaa agba nke ngwụcha-ikpeazụ iko FA, ebe Man Utd ga-anọ n'ịta ikikere eze.

Goolu abụọ Raul Jimenez na Diogo Jota nyere na nkeji 70 na 76 zuru itinye Man Utd na gbagharịa.

Ndị Wolves emeghi ebere ka ha gbakasịchara Man Utd ahụ, mee ka ha sie "bọọlụ bọọlụ".

Marcus Rashford mechara chọta ụkwụ ya n'azụ poostu na nkeji 90 na ụma, mana nke ahụ ezughi ịkwụsị ụgbọ bu Man Utd ala kanaị.

Akwụkwọ edo edo e ji adọ aka na ntị rịrị ibe ya elu n'egwuregwu a ka ma ndị Man Utd ma ndị Wolves metachara ihe e ji dọọ ha aka na ntị; ogbuopi ji akwụkwọ a dọọ mmadụ asatọ aka na ntị.

E nyere Victor Lindelof akwụkwọ nchụpụ, mana ka e nyochara VAR, ogbuopi budatara, nye ya naanị nke ịdọ aka na ntị.

Mmeri Wolves mere ya mbụ ha na-eru agba ngwụcha-ikpeazụ n'ime afọ iri abụọ na otu.

Ka ọ dị ugbua, emeriela Ole Gunnar Solskjaer ugboro abụọ so ibe ya n'azụ.

Akụkọ ga-amasị gị:

Isiokwu Ndị Emetụtara