Nigeria vs Seychelles: Super Eagles abọrịala Seychelles ka ọkụkọ

Ndị Super Eagles Image copyright Getty Images

Ugo Naịjirịa ji eje mba akparala ọkụkọ ndị Sychelles ma dọrie ya n'asọmpị ikpeazụ eji etozu oke n'Iko mba Afrịka.

Super Eagles nwetere goolu mbụ ha bụ penariti site n'aka ọgba n'ihu bụ Idion Ighalo na nkeji iri atọ na ise.

N'atụfughị oge n'ihe dịka nkeji iri anọ na otu ndị Seychelles mere ka ha bụ dimkpa ma saa goolu ahụ site n'aka Roddy Melanie.

Otu egwu bọọlụ abụọ ndị a nọ n'ogogo a rue ngwụcha ọkara mbụ asọmpi ahụ.

Dịka ọkara nke abụọ malitere na nkeji iri ise na otu, ugo Naịjirịa wee felie ma wụnye goolu ọzọ nke Henry Onyekwuru ji isi nye

N'iji gosizie mba Seychelles nkarị Moses Simon mezuru ya ọkpụ goolu atọ chara acha asatara naanị otu.

Mmeri a mere Naịjirịa ji gbaa ndị mbụ n'otu ha n'itozu oke asọmpi Iko mba Afrịka.

Ebe Seychelles buru klassị n'isi dịka ha enweteghi otu mmeri n'agba ntozuoke a niile.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: