Nigeria vs Libya: Naijiria anyụnyela Libya mmamiri n'anya

Otu egwu bọọlụ ndị nọ n'okpuru afọ iri abụọ na atọ. Image copyright @thenff

Ụmụ ugo Naịjirịa ji eme ọnụ nara mba Libya ụra n'anya site n'ịsụnwe ha ọkpụ goolu anọ chara acha anasataghị otu.

Ndị egwu Naijiria gosiri ndị Libya nkarị bido na mbido rue mgbe e gbubiri bọọlụ n'asọmpị ha gbara n'amaegwuregwu 'Stephen Keshi Stadium' dị n'Asaba Delta steeti na mgbede Monde.

Ndị Libya gbara Naịjirịa ọkpụ abụọ n'ụkwụ nke mbu na mba ga nke mere ya ọkpụ anọ asatara abụọ na mgbakọ Naịjirịa ji merie.

Victor Osimhen mepere neetị ndị Libya na nkeji iri atọ na abụọ asọmpị a malitere.

Ọ gara n'ihu inye goolu abụọ na nke atọ na nkeji iri isii na ise nakwa nkeji iri asatọ na abụọ.

Nke a mere ya ọkpụ goolu atọ nwaamadị a nyere iji nye Naịjrịa mmeri.

Kelechi Nwaka gbara oke shọọtụ bụ nke gara kụọ n'igwe na-eche neetị ma mụọ na nke oche goolu ndị Libya kụpụrụ.

Nwafọ Naịjirịa na-agbara Sporting bụ David Okereke sụnyere goolu nke anọ na nkeji iri itoolu na atọ dịka bọọlụ chọziri ịgwụ.

Mmeri a mere ụmụ Imama Amapakabo ji tozuoke n'agba nke ikpeazụ asọmpị a ga-adị n'ọnwa Nọvemba.

Akụkọ ga-amasị gị: