Cardiff City vs Chelsea: Chelsea na Liverpool bụ ugwu nyịrị Cardiff na Tottenham

Chelsea v Cardiff Image copyright Getty Images

Asọmpị Premier Lig ndị agbara n'ụbọchị ụka bụ ndị n'ọchị ndị n'akwa.

Chelsea bu ụzọ nye otu Cardiff City ọkpụ goolu abụo asatara otu mgbe ha kwatara ya.

Cesar Azpilicueta nyere goolu mbụ zọpụtara Chelsea ebe Loftus-Cheek nyere goolu nke abụo bunyere ha mmeri.

Liverpool a ga-emeri Premier League?

Image copyright Getty Images

Ọ bụ okwu ọtụtụ mmadụ kpụ n'ọnụ ugbua dịka ha ji ọkpụ goolu abụo nyụọ otu Tottenham anya.

Ya mere na ha nọzị n'ọnọdụ nke mbụ na tebulu Premịa Lig

Nke a mee, ọ ga-abụ mbụ n'ime afọ iri abụọ na itoolu ha ga-ebuli ya bụ iko.

Isiokwu Ndị Emetụtara

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a