Chelsea vs Brighton: Chelsea etiela epele n'isi Brighton

Chelsea na Brighton Image copyright Getty Images

Otu egwuregwu Chelsea, Man City na Tottenham e werla ndị ogbo ha Brighton, Cardiff na Crystal Palace zụọ epele n'asọmpi Ịnglish nke a ma ka English Premier.

Chelsea ji ọkpụ goolu atọ chara acha asataghị otu merie ndị Brighton & Hove Albion na ọgbọ egwuregwu ha bụ Stamford Bridge.

Ọ bụ Olivier Giroud, Eden Hazard na Ruben Loftus-Cheek nyere Chelsea goolu na nkeji 38', 60', na 63' n'usoro.

Dịka ọ dị ugbua, Chelsea ji ọnụọgụgụ 63 nọrọ na ndị ise n'ogogo tebụlụ asọmpi premier lig.

Image copyright Getty Images

N'ebe ọzọ Cardiff City ji nkata kpọrọ goolu abụọ n'aka Manchester City.

Kelvin De Bruyne na Leroy Sane enyere goolu ha na nkeji 6' na nkeji 44' n'otu usoro.

Manchester City ka bụ ndị mbụ na tebụlụ n'ọnụọgụgụ 80.

Image copyright Getty Images

N'otu aka ahụ Tottenham sara ndị Crystal Palace isi site n'inye ha ọkpụ goolu abụọ.

Goolu ha si n'aka Heung-Min Son na nkeji 55' nakwa Christian Erikson na nkeji 80'.

Mmeri a dosara Tottenham na ndị atọ n'ogogo Tebụlụ ebe ha ji ọnụọgụgụ 64.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: