BBC Nwaanyị kachasị agba bọọlụ n'afọ 2019 - Họpụta onye masịrị gị

Lucy Bronze
Nkenke aha onyonyo Nwafọ mba Ịngland bụ Lucy Bronze ji ọkwa ugbua.

E wepụtala aha ndị na-azọ BBC Nwaanyị Kachasị Agba Bọọlụ nke afọ 2019 - enwereike ịhọpụta onye masịrị gị.

Mmadụ ise na-azọ ọkwa a nke BBC World Service na-ahazi bụ ndị ọkachamara gụnyere ndị nchịkọta egwuregwu bọọlụ, ndị ọgba bọọlụ, ndị nhazi nakwa ndị ntaakụkọ bọọlụ.

Ndị ahọpụtara gụnyere:

  • Pernille Harder - Na-agbara Vfl Wolfsburg n'ebe ihu
  • Ada Hegerberg - Na-agbara Olympique Lyonnais n'ebe ihu
  • Lindsey Horan - Na-agbara Portland Thorns n'ebe etiti
  • Sam Kerr - Na-agbara Chicago Red Stars and Perth Glory n'ebe ihu
  • Saki Kumagai - Na-agbara Olympique Lyonnais n'ebe azụ

Ohere ibinyeaka ga-emechi na Tọzde, 2 Mee n'elekere asatọ nke ụtụtụ, a ga-akpọpụta onye meriri na Wenezde, 22 Mee na websaịt BBC World Service nakwa BBC Sports.

I nwere ike Pịa aka ebe a ka ibinyeaka.

Nke a bụ ihe ikwesiri ịma maka mmadụ ise na-azọkwa a nke nọ n'afọ ise ya.

Pernille Harder

Image copyright Reuters

Afọ ole: 26 Mba: Denmark Ugboro ole ọ gbarala bọọlụ: 110

Otu egwuregwu: VFL Wolfsburg Ọnọdụ: Ebe ihu

Harder gbachara asọmpi afọ 2017-18 ebe o ji goolu 17 bụrụ onye kachasị enye goolu na Bundesliga nke ụmụnwaanyị ma nyere Wolfsburg ịmabute ike ugboro abụọ kpakọrọ ọnụ.

Ọ gbara ma nye goolu n'asọmpi ikpeazụ nke Champịọns League afọ gara aga megide Olympique Lyonnais, mana ọ mabuteghi iko a mgbe eji ọkpụ anọ asatara otu merie ha.

Agbanyeghi nke a, Harder turuugbo nke onwe ya dịka nwaanyị kachasị agba bọọlụ nke Uefa afọ 2018. Ọ bụkwa osote onye turuugo Ballon d'Or nke ụmụnwaanyị.

Ada Hegerberg

Image copyright RONNY HARTMANN

Afọ ole: 23 Mba: Norway Ugboro ole ọ gbarala bọọlụ: 66

Otu egwuregwu: Olympique Lyonnais Ọnọdụ: Ebe ihu

Hergerberg mabutere iko Champions League nke ugboro ato kpokotara onu n'aha Olympique Lyonnais n'afo gara aga ma nyekwa goolu 15 n'asompi ahu dike otu egwu ya chi mmeri aka abuo na Spen nakwa Europe.

Hegerberg enyela goolu 193 kemgbe o banyere otu egwu ya n'afo 2014.

O nyere goolu 19 na mbata ya n'asompi 18 n'afo a.O tinyere aka n'akwukwu ga-aghati oge ya n'otu ahu na Sọma gara aga.Nwafo Norway na anaghi agbaziri Norwaybboolu bu nwaanyi mbu turuugo Ballon d'Or n'afo 2018.

Lindsey Horan

Image copyright MARK RALSTON

Afọ ole: 24 Mba: USA Ugboro ole ọ gbarala bọọlụ: 62

Na Seputemba afo 2018, Horan turu ugo nwaanyi kachasi ada ọnụ ahịa na National Women's Soccer League (NWSL).

O wee buru onye otu egwu Portland Thorns mbụ nwetara nturuugo a mgbe o nyere goolu 13 na ententes aka inwete goolu abuo n'ime asọmpị 22 n'afọ a.

Horan nyere otu egwu ya aka iru agba ikpeazu asọmpi NWSL ebe ha gbara ndi nke abụọ n'ihi mmeri otu North Carolina Courage meriri ha.

Sam Kerr

Image copyright DANIEL POCKETT

Afọ ole: 25 Mba: Australia Ugboro ole ọ gbarala bọọlụ: 67

Kerr onye na-agbara ndi Perth Glory na Chicago Red Stars boolu ugbua bu okachasi enye goolu n'asompi NWSL, o nyetekwara ogogo a n'asompi W League nke Australia n'onwa Jenuwari afo 2019.O ritere buutu olaedo nke ugboro abuo kpokoro onu n'afo 2018 dika o nyere goolu 16 na enyemaka 19 n'otu egwu Red Stars.Emere Kerr onye ndu otu egwu mba Australia n'onwa Febuwari, o duru ha imabute iko mba ndi Australia ha nke mbu.

Saki Kumagai

Image copyright FRANCK FIFE

Afọ Ole: 28 Mba: Japan Ugboro ole ọ gbarala bọọlụ: 102

Kumagai, onye mabuterela Iko Mbauwa du ndi otu egwu mba Japan n'asọmpi Asian Cup n'afọ 2018 bu nke mabutere na mbụ n'ime afo ano.

O so na ndi otu egwu Olympique Lyonnais mabutere iko abụọ n'afo 2017-18.

O mabutela Iko Champions League ugboro atọ.

Kumagai gbaliri ike ya ịhụ na otu egwu mba Fransi a bụ ndi na-eke nkwụcha nke oma, nke mere e ji nye ha naani goolu isii n'asọmpi 20.