Man City vs Tottenham: Mmiri eriela Man City n'azụ ụlọ ha

Aguero nke Man City

Ebe foto si, Getty Images

Goolu zoro ka mmiri mgbe Man City na Tottenham kwasuru ya n'ọgbọ egwuregwu Etihad n'asọmpi Champịọns League.

Raheem Sterling nke Man City ji igodo gbape ọnụ ụzọ goolu na nkeji anọ asọmpi a malitere.

Ngwa ngwa ahụ Heung-Min Son nke Tottenham gosiri Man City nke tọrọ Bịati n'ịsụnye goolu abụọ na nkeji asaa nakwa nkeji iri.

N'ime otu nkeji nke a mechara Man City mere ka ndị tetara n'ụra mgbe Bernado Silva na Raheem nyere goolu na nkeji iri na otu na nke iri abụọ na otu.

Nke a mere ọkpụ goolu ise a na-enye n'etiti otu egwuregwu abụọ ndị a n'ime nkeji iri abụọ na otu.

Pep Guardiola onye nchịkọta Man City

Ebe foto si, Reuters

N'agba nke abụọ n'ime asọmpi a Sergio Aguero wụbatara dịka nwa agụ akpara aka n'ọdụ ma nye goolu nke na nkeji iri ise na itoolu.

Otu abụọ ndị a kere nkwụcha ọtụtụ oge rue mgbe Fernando Llorente ji ukwu ya nye goolu na nkeji 73 mana enyochara n'ihe onyonyo tupu agụnye ya dịka goolu.

Nke gbawara ndị Man City obi karịa bụ mgbe agụpụrụ goolu Sterling nyere ma kwuo na ọ nọ "Offside" site n'onyonyo "VAR".

Agbanyeghi na Man City gbara Tottenham ọkpụ anọ asatara atọ, Tottenham gara n'ihu merie n'ihi goolu ha nyere n'ụlọ ndị Man City.

Mmeri a bụ nke mbụ Tottenham na-eru agba ọkara ikpeazụ asọmpi Uefa Champịọns League.

Tottenham ga-ezute Ajax ebe Liverpool na Barcelona ga-achịpụya n'agba ọkara ikpeazọ asọmpi a.

Akara ntụ-ntụ

Akụkọ ndị ga-amasị gị: