Easter Celebration: Ihe ndị ị maghị maka 'Holy Thursday'?

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Ịsa ụkwụ sọ n'emume a na-eme ụbọchị Tọzde dị nsọ

Ọtụtụ n'ime ndị mmadụ gụnyere mndị otu Kraisti na ndị okpukpere chi Ndị ọzọ mara Tọzde dị nsọ nke a kpọrọ 'Holy Thursday' na Bekee dịka Tọzde tupu 'Good Friday' ụbọchị a kpodore Jisọs Kraisti n'obe.

Mana kedụ ihe ụbọchị a ndị ụka Kraisti na-eme emume ya n'ụzọ pụrụ iche pụtara?

Na nkọwa ndị ụka Katọlik, 'Holy Thursday' bụ ụbọchị ncheta oriri ikpeazụ Jisọs Kraisti na ndị ụmụazụ ya riri tupu a kpọgịde ya n'obe.

Dịka Sista Judith Madueke ,onyeisi nkuzi ụka Katọlik na Lagos Archdiocese siri kwuo, " Tọzde dị asọ bụ Tọzde tupu Ista, ụbọchị ncheta nhiwe Jeso Christi hiwere Ukarist n'oge oriri ikpeazụ."

N'oriri ahụ, dịka Ozioma John 13:3-17 siri dee ya, Kraisti sara ụmụazụ ya ukwụ iji kuziere ha umeala nakwa ị gbara ndị ọzọ odibo.

Ọ bụkwa ụbọchị Kraist mere emume ngabiga 'Passover feast' tupu a agbodo ya n'obe.

Nkenke aha onyonyo Holy Thursday bụkwa ụbọchị ncheta ụbọchịKraistị hiwere oriri nsọ

Ndị ụka Katolik na-ahụkwa emume a dịka ụbọchi Kraisti hiwere echichi ụkọchukwu.

Sista Madueke kọwara " ụbọchị Tọzde dị nsọ, bịshọp na ndị ụkọchụkwụ na-agbakọ aka mee ofufe nro iji gosi njikọta ọnụ ebe bishọp na-anọ gọzie mmanụ atọ: mmanụ maka ndị na-anata sakaramenti; mmanụ maka ite ndị ọrịa nakwa mmanụ e ji echi ndị ụkọchụkwụ."

Na nkọwa ya, Samuel Uhie bụ onye ụkọchukwu ukwu nke St John Anglican Church,Falomo, Ikoyi Legọs, kwuru na 'Holy Thursday' bụ "ncheta etu Chukwu si zọpụta ụmụ Israel n'aka ndị Egypt."

Akụkọ ga-amasị gị: