Walter Onnoghen: Ụlọikpe amaala ya Ikpe

Walter Onnoghen

Ebe foto si, @Crevo360_Ng

Nkọwa foto,

Justice Walter Onnoghen

Akụkọ na-erụ anyị ntị na-ekwu na ụlọikpe pụrụ iche nke a kpọrọ CCT ekpebiela na ikpe mara Walter Onnoghen n'ikpe gbasara nkwupụta akụ ya.

Ụlọikpe ahụ machiwara ya inwe ọkwa ọbụla n'ọha afọ 10 ma napụkwa ya ọkwa niile o jibụ.

Ha jichiri ego niile achọtara na akara ụlọakụ ya nyefe n'aka gọọmentị etiti Naịjria.