Walter Onnoghen: Ụlọikpe amaala ya Ikpe

Ebe foto si, @Crevo360_Ng
Justice Walter Onnoghen
Akụkọ na-erụ anyị ntị na-ekwu na ụlọikpe pụrụ iche nke a kpọrọ CCT ekpebiela na ikpe mara Walter Onnoghen n'ikpe gbasara nkwupụta akụ ya.
Ụlọikpe ahụ machiwara ya inwe ọkwa ọbụla n'ọha afọ 10 ma napụkwa ya ọkwa niile o jibụ.
Ha jichiri ego niile achọtara na akara ụlọakụ ya nyefe n'aka gọọmentị etiti Naịjria.