Chelsea vs Burnley FC: Chelsea agbọghị ụja n'azụ ụlọ ha

Chelsea na Burnley Image copyright EPA
Nkenke aha onyonyo Chelsea na Burnley

Egwu a malitere n'oge tụwa nkọ dịka Burnley ji nkeji asatọ e ji malite egwuregwu were tinye goolu mbụ Jeff Hendrick ji goolu ahụ mee Chelsea "ị makwa ndị anyị bụ".

Na-erughi nkeji anọ nke a mechara, Eden Hazard buru nri chinyere bunye N'Golo Kante; onye ji ya gbakaa neetị iji nweta goolu mbụ Chelsea ma gwa ha "kpachara anya makana ọ bụ be anyị ka unu bịara".

Na-erughikwa nkeji abụọ ọzọ (14"), Gonzalo Higuain nke Chelsea buba goolu ọzọ na mpio Burnley.

Ndị Burnley ekweghi Chelsea kute ume ndụ, ka ha sara ya bụ goolu na nkeji 24.

Ashley Barnes sara goolu ahụ mere ka ụzụ tụọ na poostu Chelsea.

Calum Hudson-Odoi nakwa Kante mechara pụọ ka ha merụrụ ahụ.

Mana asọmpi a kpụ ọkụ n'ọnụ biri na goolu abụọ abụọ, n'agbanyeghị mbọ niile Chelsea gbara ịtụkwasị ọzọ.

Mmeri a emeela ka Chelsea rifere Arsenal ma nọrọ n'ogogo anọ na tebulu Premier League.

Akụkọ ga-amasị gị

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionKilliwee Nwachukwu story

Isiokwu Ndị Emetụtara

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a