Everton vs Man United: A bọkasịala Man United ka ọkụkọ 'Easter'

Paul Pogba nke Man United Image copyright Getty Images

Manchester United agbakwala ọnyụpa ọzọ dịka ha natara mkparị n'aka Everton ndị gbara ha ọkpụ goolu anọ asataghị otu.

Man United malitere nkeọma mgbe ha kwanyere Everton ọkụ n'ike na mmalite asọmpi a.

Mana Everton tụgharịrị buru ụzọ sụnye Man United goolu nke Richarlison nyere na nkeji 13 site n'enyemaka Calvert-Lewin.

Dịka a ka kpụ okwu n'ọnụ na nkeji 28, Everton si n'aka Sigurdsson gbawakwuo obi ndị Man United n'inye goolu nke abụọ.

Everton nọ n'enwete onwe ha dịka ha ekweghi Man United kpaa ike ọbụla ruo mgbe agba nke bụ kwụsịrị na nkeji 45.

Dịka agba nke abụọ malitere, Lucas Digne nke Everton, gbara aka ahịa n'imezu goolu ha atọ na nkeji 56.

Ebe a ka ike nọ gwụzie ndị Man United, ọ dị zie ka ha amaghị nke egwu na-akụ.

Ebe Everton nọ bọọzie Man United ka ọkụkọ 'Easter' bụ na nkeji 64, mgbe Theo Walcott nyere goolu nke anọ, nke mere ọkpụ anọ chara acha asataghị otu.

Merie a bụ mbụ Everton ga-eji ọkpụ goolu ruru anọ merie Man United kamgbe afọ 1981.

Dịka ọ dị ugbua, Manchester United nọ ndị isii ns tebụlụ Premier League n'ọnụ ọgụgụ 64.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: