Arsenal vs Crystal Palace: Akụọla Arsenal isi aba okpu n'ụlọ ha

Arsenal Image copyright Getty Images

Crystal Palace mere Arsenal ọ nọ nso erughiaka dịka ha ekweghi ka Arsenal rute ha nso na goolu.

Goolu Christain Benteke nke Crystal Palace nyere na nkeji 17 nakwa goolu abụọ ọzọ ha nyere n'ime nkeji asatọ kagburu olileanya Arsenal nwere iso na ndị ga-anọ n'ogogo anọ na tebụlụ.

Dịka asọmpi a na-aga n'ihu Mesut Ozil weghachịrị olileanya ndị Arsenal na goolu o nyere na nkeji 47.

Mana Everton kpọrọ ekwe nkụ na nkeji 61, imemina Arsenal dịka Wilfred Zaha nyere goolu nke abụọ ha.

N'iji gbarie obi ndị Arsenal, James McArthur ji goolu o nyere na nkeji 68 gwa ndị Arsenal na ohere adịghịrị ha imeri.

Pierre-Emerick Aubameyang nyeturu Arsenal obere olileanya site na goolu ya bịara na nkeji 77.

Everton fooro ntụtụ taa ma kwechiri na Arsenal agaghị enyeta ha goolu ọzọ agbanyeghi na ha bịara n'ụlọ Arsenal.

Mmerie Everton meriri Arsenal n'ụlọ kagburu ugboro iri Arsenal nọrọla n'ụlọ ha bụ Emirates gbaa bọọlụ a na-emerighi ha.

Ugbua Arsenal na Chelsea ji ọnụọgụgụ 66 mana Arsenal ji otu ogogo kara Chelsea na tebụlụ Premier League.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Isiokwu Ndị Emetụtara

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a