Wolves vs Arsenal: Wolves arachala Arsenal ka ofe nkupu

Otu egwuregwu Arsenal Image copyright Reuters

Arsenal ahụghị bọọlụ gbaa taa dịka Wolves napụrụha ha ụkwụ site n'ịsụnye ha ọkpụ goolu atọ asatara naanị otu.

Wolves malitere ịkaji Arsenal nku na nkeji 28 mgbe Ruben Neves ji "Free kick" nye goolu mbụ ha.

Ka a na-ekwu nke a na-ekwu ndị Wolves nwetere bọọlụ n'akụkụ bụ nke Matt Doherty ji isii ya makpuo n'ime neetị na nkeji 37.

N'iji pịa Arsenal ụtalị, Diogo Jota nke Wolves ji oke ọsọ kpaa ndị otu Arsenal abụọ ma si n'okpuru aka oche goolu ndị Arsenal bụ Leno wụnye goolu ọzọ na nkeji 45.

N'ihe karịrị ọkara n'ime agba nke abụọ, ndị otu abụọ a kwechiri rue na nkeji 80 mgbe Sokratis Papastathopoulus nyere goolu nkasi obi ndị Arsenal.

Arsenal gbọrọ ụja niile ha nwereike mana Wolves gwara ha na obighi n'ịgbọ ụja ma were ọkpụ atọ asatara otu merie ha.

Mmeri a ndị Wolves meriri Arsenal bụ mbụ ha na-emeri ha kamgbe afọ 1979.

Dịka ọ dị ugbua Arsenal ji ọnụọgụgụ 66 nọrọ na ndị ise n'ogogo tebụlụ Premier League.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionKedu ebe Igbo si?

Isiokwu Ndị Emetụtara