Man United vs Man City: E gweriela ọkpụkpụ Man United ka Everton bọkachara ha

Ndị egwuregwu Manchseter United Image copyright Getty Images

Ihe mgbu ndị Manchester United achọghị ịkwụsị akwụsị dịka ogbo ha Man City tigburu ha n'azụ ụlọ ha taa.

Ndị otu egwuregwu abụọ ndị a kpọrọ ekwe nkụ na onweghi onye ga-enye ibe ya goolu ruo mgbe agara ezumike agba nke mbụ n'asọmpi a na nkeji 45.

Mana dịka agba nke abụọ malitere, Man City bidoro lụwa Man United ka di mgbe Bernado Silva nyere goolu na nkeji 54.

Ndị Man United bere ka ọzọ emela mana ọzọ mechara mee dịka Man City sụnyere goolu abụọ ha si n'aka Leroy Sane n'ime nkeji 66.

Mana ikpeazụ Manchester City nyụrụ nsị n'azụ ụlọ ndị Man United n'onweghi ihe United metara ha.

Manchester United ji ọnụọgụgụ 64 nọrọzie na ndị isii ugbua n'ogogo tebụlụ.

Mmeri a bugoro Man City na ndị mbụ n'ogogo tebụlụ Premier league n'ọnụọgụgụ 89 ebe Liverpool ji 88 na-esote ha.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: