Barcelona vs Liverpool: E tiela Liverpool ịgba

Lionel Messi Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Messi nyere ọkpụ goolu abụọ n'ime atọ Barca jiri chie Liverpool ọnụ n'ala.

Barcelona ejirila ọkpụ goolu atọ gbajuo Liverpool afọ n'asọmpi Champions League.

Goolu onye egwu Luis Suarez ji gbakaa neetị Alisson na nkeji 26 e ji malite bọọlụ, zuru ịkpọdo ndị Liverpool n'obe nchekasị.

Tupu ihe mgbu ha ebido, e wepụrụ Naby Keita ka ọ gbatara mmerụ ahụ, jiri Jordan Henderson tichie ya.

Ka a banyere agba nke abụọ, Lionel Messi gosiri ihe e ji akpọ ya "odogwu n'agha" ka ọ dọriri neetị Alisson ọzọ na nkeji 75.

Ka ọ dị ka nke ahụ ejughi ya afọ, Messi tụkwara ha ka agwọ ọzọ ka ọ gbakpuru goolu nke abụọ ya na nkeji 82.

Olileanya ndị Liverpool gwụrụ ka goolu ahụ sụnyere, n'agbanyeghi ihe niile Mohamed Salah gbalịrị itinye bọọlụ na neetị ndị Barcelona.

Gbaa elu, gbaa ala, bọọlụ jụrụ ịba na neetị, nke mere ka ọ gwụ n'ọkpụ atọ ahụ.

Liverpool ga-eleta Barcelona ọbịa n'Anfield n'ụbọchị 7 nke ọnwa Mee a, ebe ha ga-anwa ike ha ịgbara isi onwe ha.

Akụkọ ga-amasị gị:

Isiokwu Ndị Emetụtara

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a