Barcelona vs Valencia: Valencia emee Barcelona ụra aga n'anya

Messi Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Messi ebee ọzọ

Ọ dị ka ajụ Liverpool gbanyere Barcelona n'asọmpi Champions League ka na-ebu ha, ka Valencia meriri ha ma bulie iko Copa Del Rey.

N'agbanyeghị na Barcelona ji bọọlụ ọtụtụ mgbe, Valencia bu ụzọ nye goolu oge Kevin Gameiro gbakara neetị na nkeji iri abụọ na otu (21).

Ka a na-ekwu nke a na-ekwu, Rodrigo atụkwasị ọzọ na nkeji iri atọ na atọ (33) iji mezuo ya abụọ, n'ime ọkara nke mbụ.

Valencia jidere onye egwu ndị Barcelona bụ Lionel Messi kechie ya ụkwụ na aka n'ọkara nke mbụ, nke bụ na ọ hụghị ụzọ mee ihe e ji mara ya.

Mana nke ahụ egbochighi ya ịgbara Barcelona aka ahịa na nkeji iri asaa na abụọ (72).

Nke a bụ nke mbụ Valencia na enye Barcelona goolu abụ n'ọkara mbụ kemgbe 1952 ha gbawara bọọlụ.

Asọmpi a bere na Barcelona 1 - 2 Velecia.

Akụkọ ga-amasị gị

Isiokwu Ndị Emetụtara

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a