Ebumnobi ndị nkwado Liverpool na Tottemham maka Champions League
Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi

Tottenham vs Liverpool: Kedụ nnụnnụ a ga-agbaji nku ya?

Ugo eberela na mgbagbu n'etiti Tottenham na Liverpool dịka ha ga-ezute ibe n'agba ikpeazụ asọmpi Uefa Champions League n'abalị.

Ndị nkwado otu egwu abụọ ndị a rụtụrụ aka na njem otu egwu ha mere site n'agba nke mbụ rue n'agba ikpezụ nke asọmpi a.

Ha kọwakwara ebumnobi ha nakwa etu otu ha ga-eji chie eze dịka ọkacha agba na mba Yorupe gbaa gburu gburu.

Ajụjụ abụrụ, "Kedụ nnụnnụ nke a ga-agbatu n'abalị a?" dịka akara eji mara uwe otu egwuregwu abụọ ndị a bụ nnụnnụ.

Cheta na Liverpool na Tottenham si n'azụ merie Barcelona na Ajax n'agba ọkara ikpeazụ asọmpi Uefa Champions League iji tozuo oke n'agba ikpezụ nke asọmpi a.

Akụkọ ga-amasị gị