Nigeria Vs Burundi: Super Eagles amalitela njem ịchọ Iko AFCON nke 4 ha

Super Eagles Image copyright AFP

Iko Mba Afịrịka nke Bekee kpọrọ African Cup of Nations malitere ụnyaahu na mba Ijipt ka mba ahụ na Zimbabwe suru mpi n'ama egwuregwu dị na Cairo.

Taata, Super Eagles nke Naịjirịa - bụ ndị tụrụ ugo n'asọmpị a ugboro atọ n'oge gara aga - ga amalite ịchu iko nke anọ ha n'ama egwuregwu Alexandrịa di n'obodo Alexandrịa mgbe ha zutere Burundi.

N'ụbọchị nke 26 nke ọnwọa Juun ha ga-ezute otu egwuregwu mba Guinea.

N'ụbọchi 30 nke ọnwa juun kwa, ha ga-agba bọọlụ nke agba nke mbụ mgbe ha na Madagascar zutere.

Agbanyeghị na Super Eagles so n'otu egwuregwu na-eme ọfụma n'Iko Mba Afịrịka kwamgbe, afọ bụ nke mbụ ha na-agba ya bụ asọmpị kemgbe ha maburu Iko ahụ n'afọ 2013.

Super Eagles achịtaghị aja n'asọmpị eji ahụpụta ndị ga-aga Iko Mba Afịrịka n'afọ 2015 nakwa afọ 2017.

Image copyright AFP
Nkenke aha onyonyo Mikel Obi nwereike na ezumike nka na Super Eagles ma agbacha asọmpị a

Super Eagles butere Iko a mbu n'afọ 1980 mgbe Naịjirịa nabatara mba Afịrịka ndị ọzọ.

Afọ iri ano gara tupu ha ebute ya ọzọ na Tunisha n'afọ 1994. Ndị ahụ butere mgbe ahụ bụkwa ndị Clemence Westerhof du gawa Iko Mba Ụwa na Amerịka n'afọ ahụ.

Afọ iri na itoolu gara tupu Super Eagles hụ Iko ahu anya na mba Saụt Afịrịka.

Onye du ha ga Saụt Afịrịka bụ Stephen Keshi - bu onye anọghịzị n'ụwa.

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Samuel Kalu dara n'ama egwuregwu, mana dọkịnta sị ọ bụ miri ezughi n'ahụ mere ya

Stephen Keshi sokwa n'ime ndị butere iko ahụ n'afọ 1994. Ọ bụ ya bu onyeisi ndi ọgba bọọlụ Super Eagles mgbe ahụ. Ya bụ, Keshi butere Iko ahụ ka onye na-agba nakwa onye nkuzi.

Mikel Obi, bụ onyeisi Super Eagles ugbua, sokwa ndị butere Iko ahụ n'afọ 2013.

Iko Mba Afịrịka nke afọ bu opuruiche, dịka ọ bu mbu mba 24 ga-ezute na ya bụ asọmpị.

Nke afọ a bụkwa nke mbụ ahaziri ka ọ gharị ịdabanye mgbe ndị mba Yurope - bụ ebe ọtụtụ ndị na-agba bọọlụ n'asọmpị a na-atụ mgbere bọọlụ - na-asụ mpị otu egwuregwu dị iche iche.

Na mbụ, ọ bụ na ọnwa Febuwarị ka a na-agba asọmpị a.

Image copyright Stephen Keshi
Nkenke aha onyonyo Stephen Keshi butere Iko Mba Afịrị ugboro abụọ, ka onye na-agba nakwa onye nkuzi

Dịka ọkwa ha dị n'Afịrịka, onweghị ndị n'ime ndị ha na Super Eagles nọ na "Group" enwereike sị na aka siri ike ruo ha n'asọmpị bọọlụ, nke mere ọtụtụ mmadụ na-eche na ha ga-pụta na agba nke mbụ gaa agba nke abụọ.

Mana, ndị ma egwuregwu bọọlụ ọfụma na-ekwu na onweghị onye a ga-asị na ọ bụ obele mmadu n'ama egwuregwu.

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a